E jidela onye na-ebipụta dọla adịgboroja n'Ondo State

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii awakpola ebe a na-ebipụta ego 'US Dollar' adịgboroja n'ebe a na-akpọ Odigbo dị n'Ondo state ma jide otu onye a na-enyo enyo na aka ya dị na mpụ ahụ.

Abayomi Jimoh bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo State mere ka a mata nke a n'ozi o kesere n'akara X soshal midia n'abalị atọ nke ọnwa Nọvemba, 2026.

Abayomi Jimoh kwuru na ebe onye ahụ nọ na-ebipụta ego dọla adịgboroja ahụ kpọnkwem bụ obodo a na-ekpọ Kinison a mpaghara Ajue dị n'okpuru ọchịchị Odigbo n'Ondo state.

Etụ e si chọpụta ebe a na-ebipụta 'US dollar' adịgboroja ndị ahụ

Abayomi sị na ọ bụ oge otu nwoke a na-akpọ Yusuf Nasiru bi n'ebe Saba, Okitipupa wetere ndị uweojii mkpesa maka ụmụnwoke abụọ ama aha ha dịka Peter Desmond na Olami Toro.

Yusuf gwara ndị uweojii na ụmụnwoke abụọ ndị ahụ bi n'ebe a na-akpọ Ode-irele biakwutere ya sị na ha chọrọ igbanwe ego dọla nara ya ego naịra n'Ọktoba 25, 2026.

Ọ gwara ndị uweojii na ha nara ya ego dọla ruru puku isii ($6,000) ka ha kwụnyere ya ego naịra ruru nde naịra asatọ na puku narị naịra isii (N8,6000,000).

Mana ha nọkatara lọghachite azụ ma kwuo na ha enweghị ego naịra ha ga-akwụ ma nwechitere ya ego dọla.

Yusuf sị na ọ bụ mgbe ya mechere ka ya ghọtara na ọtụtụ ego dọla ndị ahụ bụ nke adịgboroja ma ga kpesara ndị uwojii nọ n'Okitipupa.

Ọ bụ oge ndị uweojii nwetere mkpesa ka ha bidoro na-achọ Peter Desmond ma mechaa chọpụta ebe ọ nọ.

Mgbe ndị uweojii na-enyocha ụlọ ya ka ha hụrụ ebe ọ na-ebipụta 'US dollar' adịgboroja nakwa nnukwu akpa ego ndị nke e bịpụtachagoro.

Kọshịọna ndị uweojii n'Ondo State bụ Felix Ohagwu enyela iwu ka e mee ezigbo nnyocha ma jide ndị niile aka ha dị n'ibipụta 'US dollar' adịgboroja ndị ahụ ma mee ka ha nwete ezigbo ntaramaahụhụ dịka iwu obodo si kwuo.

Felix gara n'ihu dọọ aka na ntị maka ndị na-eme ihe gbasara ego mba ofesi maọbụ mgbanwe ego ka ha sachaa anya ha hara ịnara maọbụ nye mmadụ ego adịgboroja.