Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
America atụọla ogbunigwe ọzọ n'agwaetiti mba Iran dị na Strait of Hormuz dịka ntuliaka oge etiti ha na-amalite
- Onye dere ya, Sareen Habeshian
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Mba Amerịka atụọla ogbunigwe n'agwaetiti Qeshm nke dị na Strait of Hormuz, dịka ndị ọrụ ọchịchị US gwara ụlọọrụ ntaakụkọ CBS.
Ụlọọrụ mgbasaozi steeti Iran bụ IRNA, kwuru na ọtụtụ mgbawa mere n'agwaetiti ahụ n'ụtụtụ Mọnde.
Ndị ọrụ Amerịka kwuru na mwakpo ahụ pere mpe ma bụrụ nzaghachị nye egbe ha kwuru na ndịagha Islamic Revolutionary Guard Corps (IRGC) nke Iran gbara ụgbọelu ndịagha America.
BBC akpọtụrụla US Central Command (Centcom), ngalaba ndịagha America na-ahụ maka ọrụ agha na mpaghara Middle East, ka ha kwuo okwu banyere mwakpo ahụ.
Ihe a na-eme tupu ntuliaka etiti oge a kpọrọ midterm elections nke America, nke ga-ekpebi ma ndị Republican maọbụ ndị Democrat ga-achịkwa ụlọomeiwu mba America.
Donald Trump na-enwete nrụgide sitere n'aka ọhanaeze nakwa n'ime otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya ka ọ kwụsị agha dị n'etiti America na Iran. Agha a malitere mgbe America na Israel wakporo Iran n'ọnwa Febụwarị.
Na mbụ n'ụbọchị Mọnde, Trump gwara ndị ntaakụkọ na ọ naghị eme ọsọ ọsọ ime ka mwakpo ndị a n'Iran kwụsị.
O kwuru sị: "N'otu ụzọ maọbụ ọzọ, anyị ga-eme ihe, ma ọ dịghị ngwa ngwa. Anyị emebiela akụnaụba ha nke ukwuu."
Ọ gwara ụlọọrụ mgbasaozi Axios sị: "Ha enweghị ego, ha enweghị mmanụ ụgbọala, ike amalitela ịgwụ ndị obodo ha n'ihi ọnọdụ a."
Ọ gbakwụnyere na US nwereike "ịga wakpo Pickaxe", ebe e kwuru na o nwere njikọ na mmepụta ngwagha nuklia nke Iran, n'ajụjụọnụ ya na Fox News n'abalị tupu ntuliaka etiti oge (midterm elections).
Trump kwuru na nke a "abụghị nnukwu nsogbu" nakwa na a pụrụ ime ya n'ime "otu awa".
N'ime ụbọchị ole na ole gara aga, ọtụtụ mmadụ amalitela iche na America nwereike ịmaliteghachi nnukwu mwakpo megide Iran mgbe ntuliaka etiti oge ahụ gachara. Mana mgbe otu onye ntaakụkọ jụrụ Trump na Mọnde ma nke a ọ bụ eziokwu, ọ zara, sị: "Mba."
Minista na-ahụ maka mmekọrịta mba ọzọ nke Iran bụ Abbas Araghchi, gwara IRNA na mbụ na mkparịtaụka "siri ike nke ukwuu" na-aga ugbua site n'aka ndị ogbugbo, iji chọọ ụzọ iji kwụsị agha ahụ n'etiti Iran na America.
Ọ kwukwara na Tehran dị njikere ugbua karịa mgbe ọbụla ọzọ maka ụzọ abụọ ahụ, ma nke ndọrọndọrọ ọchịchị na mkparịtaụka udo, ma nke agha.
Ma sị na ọ dị mba America n'aka ịhọrọ ma ọ ga-agbaso "ụzọ amamihe" nke mkparịtaụka maọbụ mee "njehie nke mwakpo agha".