Ụzọ e nwereike iji tọhapụ Nnamdi Kanu - Ọkaiwu Ologun

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọkaiwu Olajide Ologun etinyela ọnụ n'okwu banyere ntọhapụ Nnamdi Kanu dịka Gọvanọ Alex Otti na-achị Abia state kwuru na ha na ndị ọnụ na-eru n'okwu amalitela inwe mkparịtaụka maka ya.

Ọkaiwu Ologun gwara BBC ụzọ ndị e nwereike iji nweta ntọhapụ Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), a tụrụ nga mkpụrụ ọka maka iyi ọha egwu.

N'okwu ya "Ụlọikpe atụọla ya mkpọrọ mana etu e nwereike isi tọhapụ ya bụ ma ọ bụrụ na onyeisiala nye ya ihe a kpọrọ pardon n'olu Bekee".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na ndị ọkaiwu na anọchiteanya Nnamdi Kanu gbara akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị, ha nwereike ime ka ụlọikpe kachasị na Nigeria legharịa ikpe ya anya.

Ọkaiwu Ologun kwuru na ihe ọzọ nwereike imetụta maọbụ gbochie ntọhapụ Nnamdi Kanu bụ ụdịrị agwa ọ kpara n'ụlọikpe oge ikpe ya na-aga n'ihu.

O kwuru na mkparị ahụ Nnamdi Kani kparịrị ndị ọkaiwu na-anọchite ya nakwa ọkaikpe nọ n'isi ikpe ya, bụ ihe jọgburu onwe ya.

Mana n'aka nke ọzọ, Ọkaiwu Ologun kwuru na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ ihe ọzọ e nwereike iji mee okwu banyere ntọhapụ Nnamdi Kanu ma kọwaa na ọ dị mkpa ka okwu banyere ntọhapụ ya bụrụ nke a kpachara anya mee iji hụ na o buteghị ọgbaaghara.

Njem ikpe Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu bụ onye Isiama Afaraukwu, dị na Umuahia Nọt n'Abia state.

Ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Nigeria.

Cheta na a nwụchiri Nnamdi Kanu na Kenya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Juun, afọ 2021.

N'abalị 21 nke ọnwa Ọktoba afọ 2021, ka gọọmenti etiti NIgeria kpụrụ Kanu ụlọikpe ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ebubo ndị a hazigharịrị n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Nke a na-eme dịka ndị uweojii nzuzọ a kpọrọ DSS n'ịchafụ kwuru na ha emechala nchọpụta ha banyere nwa amadị ahụ.

Ebubo ndị a boro ya dịka o si dị n'akwụkwọ ikpe ya nke BBC News Igbo nwetara oge ahụ gụnyere iyi ọha egwu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Mana ọgbara akwụkwọ n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti n'Abuja 4 Febụwarị 2026 iji gbagha ikpe ahụ a mara ya.

Kanu kwuru na ya chọrọ ka ụlọikpe kagbuo ikpe a mara ya n'ikpe nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/383/2015.

Ọ bụ Ọkaikpe James Omotosho mara Nnamdi Kanu ikpe ma kwuo ka tụnye ya n'ụlọmkpọrọ dị na Sokoto State.

N'agbanyeghị na ọtụtụ malitere ịkpọ oku ihe mere o ji bụrụ n'ụlọmkpọrọ Sokoto ka ụlọikpe kpọgara, Ọkaikpe Omotosho gara n'ihu kwuo na Nnamdi Kanu ga-anọrịrị n'ụlọmkpọrọ Sokoto state ahụ.

Anyị chọrọ ka ha tọhapụ onyendu Ipob Nnamdi Kanu - Gọvanọ Otti

Aka na-achị Abia state bụ Alex Otti ekwuola na ya na ndị ogbo ya n'Ọwụwa Anyanwụ na-agba mbo n'azụ iji hụ na a tọhapụrụ onye ndu otu nnwereonwe biafra , Indigenous People of Biafra(IPo) bu Nnamdi Kanu

Otti kwuru nke na nso nso a n'ọgbakọ ya na ndị ntaakụkọ n'Umuahịa.

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja tụrụ Nnamdi Kanu nga mkpụrụ ọka ma tụga ya na mkpọrọ Sokoto maka okwu metụtara iyi ndụ ọha egwu.

N'ọsịsa ajụjụ a jụrụ ya banyere ihe ọ na-eme ji hụ na a tọhapụrụ Nnamdi Kanu.

" Ama m na ị ma na dịka a machara ya ikpe, na m agaala hụ ya na Sokoto."

" Ọ bụ onye ebe, mụ na ndị ogbo m na-akpa maka mbọ etu ọ ga-esi enwere onwe ya ."Mana etu etu a ga-esi eme ya abụgh i ihe anị kwesịrị ịgba n'anwụ ebe a ka ịgbara ikposa ihe a na-eme."