Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Kedụ etu mkpebi ụlọikpe ịchụpụ David Mark n'ọkwa onyeisioche ADC ga-esi emetụta Atiku Abubakar?
Dịka ụlọikpe ukwu dị n'Abuja chụrụla David Mark n'ọrụ dịka onyeisioche pati African Democratic Congress (ADC) ma kagbuo ihe niile pati ahụ merela iji sonye na ntuliaka na-abịa n'afọ 2027, ajụjụ dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ, kedụ etụ mkpebi a ga-esi metụta Atiku Abubakar dịka onye ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2027?
Ọkaiwu Luka Musa Haruna so na ndị ọkaịwụ wepụrụ okwu ahụ n'ụlọikpe kọwara na mkpebi a pụtara na pati ADC agaghị enwe ndị ga-eji ọkọlọtọ ha zọọ ọkwa ọbụla n'afọ 2027.
Ọzọkwa bụ na Atiku Abubakar na ndị ọzọ niile ji ọkọlọtọ pati ahụ na-azọ ọkwa akụọla afọ n'ala ma ọ bụrụ na mkpebi ahụ guzoro.
Cheta na ọ bụ nwaamadị a na-akpọ Nafiu Bala Gombe bụ onye gbara akwụkwọ wegara okwu ahụ n'ụlọikpe.
Gombe kwuru na David Mark abụghị onyeisi oche otu Pati ADC kama na ọ bụ ya onwe ya kwesiri ịbụ onyeisioche pati ahụ dịka Ralph Nwosu bụbu onyeisioche ha gbara arụkwaghịm.
Ọ gwara ụlọikpe ka ọ machie David Mark na Aregbesola bụ odeakwụkwọ ADC ikwu na ha bụ ndịisi pati ADC.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Atiku na ADC akatọọla mkpebi ụlọikpe ahụ
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC), na onye ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka Nigeria na-abịa n'afọ 2027, bụ Atiku Abubakar, akatọọla mkpebi Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja bụ nke chụrụ Sinetọ David Mark na ndịisi ya n'ọrụ dịka onyeisioche pati ahụ.
Mkpebi ụlọikpe ahụ kagbukwara ihe niile ndịisi pati ahụ merela gụnyere ịhọpụta Atiku Abubakar dịka onye ga-eji ọkọlọtọ pati ahụ azọ onyeisiala na ntuliaka 2027.
N'ozi ọnụ na-ekwuru otu achụmta vootu Atiku, bụ Phrank Shaibu, wepụtara n'ụbọchị Tọzde 5 Nọvemba 2026, ka Atiku Abubakar kwuru na oge ụlọikpe wepụtara mkpebi a abụghị ihe mere na mberede.
O boro ebubo na mkpebi ahụ bụ atụmatụ iji belata nkwado ọ na-enweta na mpaghara ugwu Nigeria, ma gbochie mgbasa ndọrọndọrọ ọchịchị ya; nke o kwuru na ozi ya na-adọta ndị mmadụ n'akụkụ dị iche iche.
Atiku kwuru na nnabata ndị mmadụ nyere ya na Sokoto state gosiri na ọtụtụ ndị Nigeria chọrọ mgbanwe, ọkachasị n'ihi oke ọnụ ahịa ihe nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa.
Atiku gara n'ihu kwusie ike na ọbụghị naanị ndị ugwu ka ọ na-anọchite anya ha, kama na ọchịchọ ya bụ ịbụ onyeisiala Nigeria niile.
N'aka nke ọzọ, pati ADC kọwara mkpebi ụlọikpe ahụ dịka atụmatụ pati pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressive Congress (APC) echere pati ndị anọghị n'ọchịchị aka mgba tupu ntụliaka afọ 2027.
Onye odeakwụkwọ mgbasaozi pati ahụ bụ Bolaji Abdullahi, rụtụrụ aka na nnabata dị ukwuu nke ndị mmadụ nyere Atiku na Sokoto state bụ ihe mere e ji wepụta mkpebi ụlọikpe ahụ ngwangwa.
Pati ahụ dọrọ aka na ntị na mkpebi ahụ abụghị naanị okwu gbasara Atiku na David Mark, kama na o nwereike imetụta ikike ọtụtụ ndị chọrọ ịzọ ọkwa ndọrọndọrọ ọchịchị n'ọkwa ọchịchị ime obodo, state na nke etiti.
Ụlọikpe achụọla David Mark ọrụ dịka onyeisioche pati ADC ma kagbuo nhọpụta Atiku Abubakar
Ọkaikpe Peter Lifu nke ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja achụọla Sinetọ David Mark dịka onyeisioche pati African Democratic Congress (ADC) nakwa ndịisi ya ndị ọzọ ma kagbuo ihe ọbụla ha mere dịka ndịisi pati ADC.
Ọkaikpe Lifu kpebiri nke a n'ụbọchị Tọzde 5 Nọvemba 2026 ma kpebie na usoro David Mark na ndị otu ji họpụta Atiku Abubakar bụ nke megidere iwu.
Ụlọikpe ahụ kwuru na eziokwu dị n'ikpe Nafiu Bala Gombe gbara n'ụlọikpe banyere etu e si họpụta David Mark onyeisioche ADC.
Gombe kwuru na ọ bụ ya kwesiri ịbụ onyeisioche pati ADC dịka Ralph Nwosu bụbu onyeisioche ha gbara arụkwaghịm.
Ọ bụ nke a mere o jiri gbaa DAVID Mark akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka ụlọikpe kagbuo nhọpụta David Mark dịka onyeisioche ADC ma machie David Mark na Aregbesola bụ odeakwụkwọ ADC ikwu na ha bụ ndịisi pati ADC.
Ihe ndị a ụlọikpe kagburu bụ nhọpụta ha họpụtara Atiku Abubakar dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ADC zọọ ọkwa onyeisiala na 2027.
Dịka akụkọ a fesara ebe niile, ọtụtụ ụmụafọ Nigeria nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu amalitela ikwu etu nke a nwereike isi metụta ntuliaka ọkwa onyeisiala a ga-eme na Jenụwarị 16 2027.
Na nzaghchi ha banyere mkpebi ụlọikpe ahụ, onye jị ọkwa nlekọta na pati ADC bụ Nkemakolam Ukandu, kwuru na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị ka kpegharịa ikpe na mkpebi a Ọkaikpe Lifu nyere.