Usoro ọchịchi Onyeisiala Tinubu si gbazite ego kamgbe 2023 na ihe ndị ha sị e ji ya eme

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu, arịọla ndị omeiwu ka ha kwado mbinye ego ruru ijeri dọla $7.7, nke bụ ụfọdụ ego gọọmentị chọrọ iji kwadoo atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2026.

Arịrịọ ọhụrụ a bịara mgbe Tinubu wepụrụ arịrịọ mbụ o zigara ndị omeiwu n'ọnwa Ọktoba, nke ruru ijeri dọla $20.52 na nde euro €1.045.

Onyeisi ndị omeiwu bụ Godswill Akpabio, mere ka a mata maka arịrịọ ọhụrụ a mgbe ọ gụrụ akwụkwọ ozi Tinubu zigaara ha na Wenezde, abalị anọ nke ọnwa Nọvemba.

N'akwụkwọ ozi ahụ, Onyeisiala kwuru na mbinye ego ijeri dọla $7.7, nke ruru ihe dịka tarị ₦10.79 n'ọnụego mgbanwe ego ₦1,400 maka otu dọla ga-enye aka mejupụta oghere dị n'etiti ego gọọmentị ga-enweta na nke ọ ga-emefu n'afọ 2026.

O kwuru na a ga-eji ego ahụ kwadoo ọrụ mmepe akụrụngwa, nchekwa, ọrụ ugbo, ahụike, ọkụ latrik na agụmaakwụkwọ.

Tinubu kwukwara na gọọmentị ga-enyocha ụzọ dị iche iche ha ga-esi nweta ego ahụ, mana na ha ga-elekwasị anya n'ịre Eurobond n'ihi na usoro a na-adị ngwa ngwa.

Kedu ka mbinye ego a si metụta mmefu ego 2026?

N'ime iwu mmefu ego afọ 2026, gọọmentị nyere onwe ya ikike ịgbazi tarị ₦29.2 iji kwụọ ụgwọ mmefu ego nke nwere ụkọ ego ruru tarị ₦31.4.

N'ime ego a, tarị ₦18.4 ka gọọmentị na-atụ anya ibiri n'ime obodo, ebe tarị ₦10.79 ga-esi na mbinye ego mba ọzọ.

Ndị omeiwu ezigala arịrịọ ọhụrụ ahụ n'aka kọmitii na-ahụ maka ụgwọ gọọmentị na mmefu ego ka ha nyochaa ya tupu ha eme mkpebi.

Kedu ego Onyeisiala Tinubu biterela kamgbe 2023?

Kemgbe ọ banyere n'ọchịchị n'afọ 2023, ọchịchị Tinubu arịọla ndị omeiwu ka ha kwado ọtụtụ atụmatụ mbinye ego maka atụmatụ mmefu ego na ọrụ mmepe.

N'ọnwa Julaị 2023, ndị omeiwu kwadoro mbinye ego ijeri dọla $800 sitere n'ụlọakụ Ụwa (World Bank) iji kwado enyemaka ego nye ezinaụlọ dara ogbenye na ndị nwere obere ego mgbe gọọmentị wepụrụ enyemaka mmanụ ụgbọala. Ọ bụ ọchịchị Muhammadu Buhari bidoro atụmatụ mbinye ego a tupu Tinubu abata n'ọchịchị.

N'ọnwa Nọvemba 2024, ndị omeiwu kwadoro mbinye ego ijeri dọla $2.209 iji kwụọ akụkụ nke mmefu ego afọ ahụ.

N'ọnwa Mee 2025, Tinubu rịọrọ maka mbinye ego ijeri dọla $21.543, ijeri euro €2.194 na ijeri yen ¥15, tinyere onyinye nde euro €65. Ndị omeiwu kwadoro atụmatụ ahụ n'ọnwa Julaị.

N'ọnwa Ọktoba 2025, ha kwadoro mbinye ego ijeri dọla $2.347 maka mmefu ego na ịkwụghachi ụfọdụ ụgwọ Eurobond. Ha kwadokwara mbinye ego Sukuk ruru nde dọla $500 maka ọrụ akụrụngwa.

N'afọ 2026, ndị omeiwu kwadoro mbinye ego ijeri dọla $6 n'ọnwa Maachị. N'ime ya, ijeri dọla $5 sitere na First Abu Dhabi Bank maka mmefu ego, ebe ijeri dọla $1 bụ nke a haziri site na Citibank maka ịrụzigharị ọdụ ụgbọ mmiri Lagos na Tin Can Island.

N'ọnwa Eprel 2026, ha kwadoro mbinye ego nde dọla $516.3 sitere na Deutsche Bank iji kwado iwu okporo ụzọ Sokoto-Badagry.

Nchegbu banyere ụgwọ Nigeria ji

Arịrịọ mbinye ego ndị a na-abịa n'oge ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere etu ụgwọ Nigeria si arị elu na oke ego gọọmentị na-eji akwụ ụgwọ ndị o ji.

Ọ bụ ezie na gọọmentị etiti na-ekwu na ibiri ego dị mkpa iji wuo akụrụngwa ma kwalite mmepe obodo, nchegbu ka dị banyere etu mba ahụ ga-esi na-akwụghachi ụgwọ ndị a.

Ụlọọrụ mba ụwa na-ahụ maka akụnaụba, International Monetary Fund (IMF), akpọọla oku ka Nigeria kwalite ụzọ ọ na-esi enweta ego ma hụkwa na ego ọ na-agbaziri na-eweta uru akụ na ụba.