Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya
Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Onyeisiala Bola Tinubu ekweela ndị Super Falcons ọtụtụ nkwa gunyere ego, ụlọ
Ihe niile i kwesịrị ịma banyere asọmpị Iko Afrịka ụmụnwaanyị Wafcon 2024
Ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma gbasara 'Chairman' Christian Chukwu
Mmasị m nwere n'ịbụ onyendu mere m jiri malite ịchịkọta ndị ọgba bọọlụ - Emeka Cavani
Ademola Lookman bụ ọkacha agba bọọlụ ebe Chiamaka Nnadozie bụ ọkacha eche bọọlụ n'Afrịka n'afọ 2024
Agamnihu m nwetara n’ihe karịrị afọ abụọ bụ nnọọ nke dị ezigbo mma - Ademola Lookman
Bruno Labbadia: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwamadị ahụ kagburu ịchịkọta 'Super Eagles'
Paralympic 2024: Shaun Anderson ji otu aka agba nta na etu egwuregwu si zọọ ya
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Noni Madueke
Onye ka Naịjirịa ga-enye ọrụ na-etiti Andersson na Renard na-achọ ọrụ nkuzi bọọlụ na mba a?
Annette Echikunwoke: etu ịda mba Naịjirịa sị ghọọ uru mba Amerika
Egwuregwu Olimpiks 2024 ebidola na Paris
Ndị Afrịka isii ga-ewu ewu n'egwuregwu Olimpik 2024 na Paris
Paris Olympics 2024 tebụlụ na-egosi ọla ndị e riterela
Lee onyeisi ojii mbụ n'Afrịka mabutere ọlaedo n'egwuregwu Olympic
Nguemo anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ

Ebe foto si, SNS
Onye na-agbaburu otu egwu bọọlụ Celtic n’etiti bụ Landry Nguemo anwụọla n’ihe mberede ụgbọala na mba Kameruun.
Ndị na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ na mba Kameruun kwupụtara n’ụbọchị Fraịde 28 Juun 2024 na nwaamadị ahụ gbara afọ iri atọ na asatọ (38) nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.
Ozi ahụ kwuru sị “otu Cameroonian Football Federation ka nụrụ akụkọ gbasara ọnwụ onye na-agbaburu otu egwu Indomitable Lion bụ Landry Nguemo, onye nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ.
“Nguemo, onye so na ndị ọkachasị akụ bọolụ n’otu egwu bọọlụ Kameruun malite n’afọ 2006 ruo 2014 ma bụrụkwa onye gbabuuru Girodins de Bordeaux. A ga-echeta ya maka ntụnyeoke ya niile n’egwuruegwu bọọlụ.
“FECAFOOT na-ezigara ezinaụlọ ya, ndị enyi ya na ndị niile egwuruegwu bọọlụ na-amasị ozi nkasiobi,” ka ozi ahụ kwuru.
Ụlọikpe atụọla mmadụ atọ nga maka ịkpaso Vinicius Jose Jr oke agbụrụ

Vinicius Jose Jr na-agbara ndị Real Madrid bọọlụ ka ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ Valencia mesoro omume ịkpa oke agbụrụ.
Nke a mere n’abalị 23 Mee 2023 n’ọgbọ egwuruegwu a kpọrọ Mestalla nke ndị Valencia.
Ka ihe ahụ mechara, La Liga kpọpụrụ mmadụ atọ ndị na-akwadọ otu egwu bọọlụ valencia ụlọikpe ebe a mara ha ikpe ma tụọ ha nga ọnwa asatọ.
Ụlọikpe machịrị mmadụ atọ ahụ ịbanye n’ọgbọ egwuruegwu nke La-liga maọbụ ebe ndị mba Spain na-agba bọọlụ rụọ afọ atọ, mana e mechara mee ya afọ abụọ.
Ndị wegara okwu ahụ n’ụlọikpe bụ Vinicius Jr La Liga na Spanish Football Federation (RFEF).
Onyeisioche La-Liga bụ Javier Tebas kwuru na ọ bụ ihe ga-enye aka ibuso ịkpa oke agbụrụ agha n’egwuruegwu bọọlụ ma nye aka iti Vinicius Jr aka n’obi.
Ọ gara n’ihu kọwaa na nke ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị dịịrị ndị na-aga n’ọgbọ egwuruegwu ịkpaarị ndị mmadụ.
“La-liga ga-achọta onye ị bụ, kpọpụ gị ụlọikpe maka ntaramahụhụ ga-eso ya”.
Ndị otu egwu bọọlụ Real Madrid kwuru na ha “ga ejisiike na-echekwa ihe njirimara ha, wepu ịkpa oke agbụrụ na ihe ịkpa oke ọbụla n’asọmpị bọolụ”.
‘Egwuruegwu Invictus na-egosi m na ọ bụghị nanị m so’
Ihe atọ mere FIFA anaghị akpọ ndị ogbuopi Naịjirịa ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị ogbuopi nwere nsogbu ahụike nke mere na ha agaghị enwe ike ruo n’ebe a chọrọ Otu mbaụwa na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ bụ FIFA ewepụtala aha ndị ogbuopi ga-eso gbuo opi n’asọmpi egwuruegwu Olympics nke ga-amalite n’ọnwa Julaị na Paris, mba France.
Otu ahụ wepụtara aha ndị ogbuopi iri na abụọ ga-anọchiteanya mba Afrịka n’egwuruegwu ahụ.
N’ime aha ndị ogbuopi ahụ ewepụtara, enweghị nke bụ nwaafọ Naịjirịa na-agbanyeghị na mba ahụ na-eto n’ike n’ike n’ihe banyere egwuruegwu bọọlụ.
Ọ bụkwa ụdị ihe a ka e mere Naịjirịa n’oge asọmpi iko mbaụwa a haziri na Qatar n’afọ 2022.
Ka osiladị, BBC jụrụ onye bụụrụ ogbuopi Naịjirịa ruru n’ogogo FIFA bụ Ibrahim Umar Fagge ajụjụ banyere ihe mere e ji eleghara ndị ogbuopi Naịjirịa anya n’ụdị egwuruegwu ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ.
Ọ sịrị “e nwere ọtụtụ ihe mere ede jiri bee nwịị, nke mbụ bụ na ọ bụrụgodu na onye ntorobịa nwee ohere ị bụ onye ogbuopi FIFA, ha agaghị enweta ọzụzụ ndị kwesịrị ekwesị nke ga-eme ka ha gbuo opi n’egwuruegwu ndị gbara ọkpụrụkpụ dịka iko mbaụwa.
“Nke abụọ bụ na ọtụtụ ndị ogbuopi nwere nsogbu ahụike nke mere na ha agaghị enwe ike ruo n’ebe a chọrọ.
“E nwekwara nsogbu afọ ole ha gbara, ọtụtụ n’ime ndị ogbuopi anyị akaala nka. Etu obi ha si akụ nakwa etu ọbara si agazu ha ahụ ga-etinye ha n’ihe izendụ ọ bụrụ ma ha gaa n’ihu na-agba ọsọ.
“Nke ikpeazụ bụ na Naịjirịa enwebughị akụrụngwa na-enyere onye ogbuopi aka a na-akpọ ‘Video Assistant Referee maọbụ VAR’ n’asụsụ Bekee,” ka Ibrahim Umar kwuru.
Dịka iwu FIFA siri kwuo, mmadụ ọbụla agaghị egbu opi n’asọmpi gbara ọkpụrụkpụ ewezuga ma onye ahụ ọ maara nke o riri n’ụzọ esi eji VAR eme ihe.
