Anthony Joshua vs Pulev: Anthony Joshua akụpụla Kubrat Pulev ọkwụrụ n'anya

Ọkụọkpọ Anthony Joshua akpọrọ Unified world heavyweight champion ji ike na ndịdị kụpụ Kubrat Pulev ọkpụ n’anya nke mere na olileanya dị na ya na Tyson Fury nwerike ịlụ ọgụ ụwa na-eche kamgbe.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Luke Fleurs: Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa

    Ndị uweojii kwuru na ha kwenyere na “ndị ahụ a na-enyo enyo so n’otu ndị na-ezu ohi ụgbọala” na mpaghara Gauteng
    Nkọwa foto, Ndị uweojii kwuru na ha kwenyere na “ndị ahụ a na-enyo enyo so n’otu ndị na-ezu ohi ụgbọala” na mpaghara Gauteng

    Anwụchiela mmadụ isii maka ogbugbu onye ọgbaabọọlụ mba South Africa bụ Luke Fleurs.

    Nwaokorobịa ahụ gbara afọ iri abụọ na anọ na-agbara otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs bụ onye ndị ohi ụgbọala gbagburu n’izuụka gara aga n’otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Johannesburg.

    N’ozi ha wepụtara, ndị uweojii kwuru na mmadụ isii ahụ a na-enyo enyo bụ ndị anwụchiri na Soweto n’ụtụtụ Wenezde 10 Eprel 2024.

    Ndị uweojii kwuru na ha kwenyere na “ndị ahụ a na-enyo enyo so n’otu na-ezu ohi ụgbọala” na mpaghara Gauteng.

    Ha kwukwara na ha ebughachitela ụgbọala onye ọgbaabọọlụ ahụ nwụrụ anwụ n’ụbọchị Mọnde.

    Fleurs bụ onye kwụ n’ahịrị na-eche ka agbanyere ya mmanụ ụgbọala tupu ndị ojiegbe awụchaa ma nye ya iwu ka ọ pụta n’ụgbọala ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Gauteng bụ Mavela Masondo gwara ndị ntaakụkọ n’ụbọchị ahụ na “ndị omekoome tụwara Fleurs egbe, kpọpụta ya n’ụgbọala ya ma gbaa ya egbe na mpaghara obi ya.”

  2. Agbagbuola ọgbaabọọlụ mba South Africa bụ Luke Fleur

    Agbagbuola otu onye ọgbaabọọlụ na mba Saụt Afrịka bụ Luke Fleurs n’oge ndị ohi gara izu ụgbọala ya.
    Nkọwa foto, Agbagbuola otu onye ọgbaabọọlụ na mba Saụt Afrịka bụ Luke Fleurs n’oge ndị ohi gara izu ụgbọala ya.

    Agbagbuola otu onye ọgbaabọọlụ na mba Saụt Afrịka bụ Luke Fleurs n’oge ndị ohi gara izu ụgbọala ya.

    Dịka ndị uweojii siri kwuo, ọ bụ n’ụbọchị Wenezde 3 Eprel 2024 ka agbagburu Fleurs n’otu ọdụ mmanụ ụgbọala dị na Johannesburg.

    Nwaamadị ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs bụ onye na-eche ka agbanyere ya mmanụ ụgbọala tupu ndị ojiegbe awụchaa ma nye ya iwu ka ọ pụta n’ụgbọala ya.

    Akụkọ kwuru na otu n’ime ndị omekoome ahụ buuru ụgbọala Fleur rie mbọmbọ n’oge ha gbagbuchara ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Gauteng bụ Mavela Masondo gwara ndị ntaakụkọ na “ndị omekoome ahụ tụwara Fleurs egbe, kpọpụta ya n’ụgbọala ya ma gbaa ya egbe na mpaghara obi ya.”

    Otu egwu bọọlụ nwaamadị ahụ gbara afọ 24 bụ Kaizer Chiefs akọwaala ọnwụ ya dịka “nnukwu ihe mwute.”

    Ha kwuru na ndị uweojii na-elebara okwu ahụ anya dịkwa ka ha ga-ewepụta ozi rijuru afọ na mgbe oge ya ruru.

    Minista egwuruegwu bụ Zizi Kodwa kwuru na “obi adịghị ya mma na a tụfuru ndụ mmadụ ọzọ n’ihi ọnọdụ tigbuo zọgbuo.”

    Fleurs sonyere otu egwu bọọlụ Kaizer Chiefs n’afọ gara aga dịka ọ gbachaara SuperSport United.

  3. Weekly exercise: Agwala ndị ọrụ Uganda ka ha na-emegharị ahụ kwa izuụka

    Gọọmenti Uganda agwala ndị ọrụ obodo niile ka ha were awa abụọ na-emegharị ahụ kwa izuụka
    Nkọwa foto, Gọọmenti Uganda agwala ndị ọrụ obodo niile ka ha were awa abụọ na-emegharị ahụ kwa izuụka

    Gọọmenti Uganda agwala ndị ọrụ obodo niile ka ha were awa abụọ na-emegharị ahụ kwa izuụka.

    Ntụziaka ahụ dị na leta onyeisi ndị ọrụ obodo mba Uganda bụ Lucy Nakyobe zigaara ngalaba ụlọọrụ gọọmenti niile enwere na mba ahụ.

    Dịka Nakyobe siri dee na leta ahụ “imegharị kwa mgbe kwa mgbe ga-enye aka chekwaa ndụ ndị ọrụ ma belata ibu nrịanrịa.”

    N’ozi gọọmenti Uganda wepụtara n’ọbaozi X, ọ sịrị na atụmatụ ahụ “ga-ebelata iri elu nke ibu nrịanrịa ya na usoro obibi ndụ so aga” na mba ahụ.

    Atụmatụ a na-abịa dịka ọ gafechara afọ abụọ ihe nnyocha e mere banyere ahụike gosiri na ogo ndị mmadụ si ebufe ibu oke na mba ahụ agbagoola site na pasenti 17 ruo pasenti 26 n’ime afọ 17 gara aga.

    Mana nke a abụghị nke mbụ ya gọọmenti Uganda na-ewepụta ụdị atụmatụ dị etu a iji gbaa ndị mmadụ ume imegharị ahụ.

    N’afọ 2018, Uganda wepụtara ụbọchị maka mmegharịahụ zuru mba ahụ ọnụ bụ nke hụrụ na ahaziri ihe omume egwuruegwu gburugburu mba ahụ.

    Kọmịshọna na-ahụ maka ọrịa ndị na-adịghị efe efe bụ Dr. Charles Oyoo Akiya gwara ndị ọrụ mgbasaozi mba Uganda na mịnịstrị ahụike nọ kemgbe na-ahaziri ndị ọrụ ya ihe omume mmegharịahụ mana ha chọrọ ka ngalaba ụlọọrụ niile nabata ya.

  4. Afcon 2023: A rọrọ m nrọ ka anyị meriri Asọmpị a

  5. Ivory Coast abụrụla dike Afrịka ka ha mabuuru Iko AFCON 2023

  6. Afcon 2023: Ugo Naịjirịa arachaala Saut Afrịka ka 'banana' Ore

  7. Afcon: Ugo Naịjirịa na Bafana Bafana Saụt Afrịka achịpụwalaya

  8. Afcon: Onye bụdị Lookman a nyeere Nigeria goolu mmeri?

  9. AFCON 2023: Lee etu tebulu asọmpi na mpụtara ya si kwụrụ ugbua

  10. Afcon 2023: Gbaa okwe a họpụta otu ị ga-akpọ gaa ọgụ ma ị bụrụ onye nchịkwa bọọlụ

  11. AFCON: Naịjirịa emeriela Ivory Coast

  12. Victor Osimhen eturula ugo 'ọkachasị agba bọọlụ' n'asọmpi Serie A' nke Italy afọ 2023

  13. Kedu etu Naịjirịa ga-esi kwalite onwe ha na njem itozu ikombaụwa?

  14. "Ịlụ ọgụ na-amasị m, ana m alụchitere nwanne m nwoke ọgụ" - Chiamaka Nwaturuocha

  15. Africa Eye: Etu ndị nhazi egwuregwu bọọlụ si emetọ ụmụntakịrị nwoke na mba Gabon

  16. Desire Oparanozie Retires: Ihe mere m ji kpebie ịla ezumike n’egwurgwu bọọlụ n’oge

  17. Afcon 2023: Kedụ mgbe asọmpi Iko Mba Afrịka ga-amalite?

  18. Ọ dị mwute na ndị mmadụ ahapụla mmeri anyị n'iko mba ụwa, na-ekwu okwu nsusuọnụ - Ochee Bọọlụ Spain

  19. Asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị nke 2023 bụ echefu echefu... Lee ihe ndị kpatara ya

  20. Ụfọdụ ihe ndị dị mkpa banyere mmalite egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n’ụwa