Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka 'April fool' na Naịjirịa
N'agbanyeghị na taa bụ ụbọchị mbụ n'ọnwa Epreelụ bụkwa ụbọchị ụka Easter, ndị mmadụ echefughị ime ndị ha hụrụ n'anya akaja.
Ụbọchị mbụ n'ime ọnwa Epreelụ kwa afọ, bụ ụbọchị eji arụsa ma mee ndị mmadụ akaja iji kpọọ ha ndị nzuzu na gburugburu mbaụwa.
Ụfọdụ na-eme ya ndị ha hụrụ n'anya, ebe ndị ọzọ na-eme ya ndị ha kpọrọ asị.
Ụbọchị April fool nke afọ 2018 dabanyere n'ụbọchị ụka Easter, nke mere na ụfọdụ ndị mmadụ etinyeghị ya n'uche ịrụsa ndị ọzọ.
BBC Igbo gara na Twitter ịchọta ihe ndị mmadụ na-ekwu maka 'April fool' nke afọ a.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
Otu onye kwuputara ka esi were ọnọdụ ịchọ ọrụ ya mee ya akaja
Onye ọzọ na-eche etu ọ ga-esi aghọgbu nne na nna ya
Ị mere ndị mmadụ akaja taa? Kedụ ihe ị mere ha?