Onye bụ Stella Okunna, nwanyị mbụ bụ ọkammụta na ngalaba agụmaakwụkwọ mgbasaozi na Naịjirịa?

Ọkammụta Stella Okunna, nwada mbụ nwetere nzere ọkammụta na ngalaba agụmaakwụkwọ mgbasaozi na Naịjirịa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọkammụta Chinyere Stella Okunna bụ otu n'ime ụmụnwaanyị mepere ụzọ ọhụrụ n'akụkụ agụmakwụkwọ mgbasa ozi a kpọrọ 'mass communication' na Naịjirịa.

A ma ya dịka nwaanyị mbụ ghọrọ Ọkammụta n'ọmụmụ 'Mass Communication' na Naịjirịa, bụ nzere o nwetere n'afọ 2001.

Agụmaakwụkwọ ya

Nwada Stella jiri ọkwa dị iche iche n'ime ụlọakwụkwọ dị iche iche.
  • A mụrụ Okunna n'obodo Uga, n'okpuruọchịchị Aguata n'Anambra steeti.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa Nsụka (UNN).
  • Ọ gara n'ihu nweta nzere Master's ya na Mahadum Leicester dị na mba Briten.
  • O mechakwara nweta PhD ya na Mahadum Lagos (Unilag).

Njem ya n'ụwa agụmakwụkwọ

  • Ọ malitere ọrụ nkuzi ya na Institute of Management and Technology (IMT), Enugu.
  • N'afọ 1994, o gara Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka (UNIZIK), ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ dị mkpa.
  • N'afọ 2001, o nwetara ogo Prọfesọ, bụrụ nwaanyị mbụ n'akụkọ ihe mere eme na Naịjirịa n'isi ọmụmụ 'Mass Communication'.
  • Ọ nọgidirị dịka naanị nwaanyị ruru ogo Prọfesọ n'isi ọmụmụ 'Mass Communication' na Naịjirịa ihe ruru afọ iri na abụọ (12), tupu nwaanyị ọzọ na-akụzi ihe enweta ogo a.
  • Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ngalaba 'Mass Communication' site n'afọ 1998 ruo 2006, nakwa site n'afọ 2014 ruo 2017.
  • Okammụta Stella Okunna bụkwa nwaanyị mbụ ghọrọ Dean nke 'Faculty of Social Sciences' na Mahadum Nnamdi Azikiwe, ebe ọ rụrụ ọrụ nlekọta ahụ site n'afọ 2016 ruo 2019.

Ọrụ ndị ọzọ nwada Stella na-arụ

Nwada Stella Okunna, abụghị naanị onye nkuzi na mahadum, o nwekwara ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ọ rụrụla.

Okammụta Stella Okunna abụghị naanị onye nkuzi na mahadum.

  • Site n'afọ 2006 ruo 2014, ọ rụrụ ọrụ n'ọchịchị Anambra steeti n'oge ọchịchị Peter Obi, ebe ọ jere ozi n'ọkwa dị iche iche:
  • Ọ bụbu Kọmishọna na-ahụ maka Ihe gbasara ozi na omenala.
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka atụmatụ akụ na ụba nakwa nkesa ego.
  • Ọ bụrụkwa onyeisi ọrụ n'obi ọchịchị steeti ahụ.
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nhazi n'etiti gọọmentị na ndị otu na-akwado mmepe obodo.

Ihe ndị ọzọ mere nwada Stella jiri gbapụta ihe

Ọkammụta Stella rụrụ ọrụ ndị ọzọ na-abụghị naanị na mahadum

Mana ịbụ onye mbụ ghọrọ Ọkammụta na ngalaba 'Mass Communication' abụghị naanị ihe mere nwada Stella Okunna ji bụrụ onye a ma ama.

N'ime ọtụtụ afọ ọ nọrọ n'ọrụ nkuzi, ọ zụlitela ọtụtụ ndị ntaakụkọ, ndị na-arụ ọrụ mgbasa ozi na ndị ọkachamara n'ụlọakwụkwọ.

Ọtụtụ n'ime ndị o kụziiri agaala n'ihu bụrụ ndị nkuzi na mahadum, ndị ntaakụkọ na ndịisi n'akụkụ ọrụ mgbasaozi.

Akụkọ banyere ndụ Ọkammụta Stella Okunna bụ nke nwaanyị banyere n'akụkụ ọrụ ọtụtụ ụmụnwaanyị na-adịbeghị mbụ ma rute n'ọkwa kachasị elu.

Ọ bụghị naanị na ọ ghọrọ onye mbụ, mana njem ya nyere aka mepee ụzọ ka ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ nwee ike isonye.