Nigeria abụrụla ndị mbụ butere iko Fifa U17 Women's World Cup n'Africa

Aha onyonyo, Nigeria abụrụla ndị mbụ butere iko Fifa U17 Women's World Cup n'Africa
Nigeria abụrụla ndị mbụ butere iko Fifa U17 Women's World Cup n'Africa
Mgbe e biputara ya

Otu egwubọọlụ Flamingos mba Nigeria ehichaala Nigeria anya mmiri dịka ha nọrọ n'ụbọchị Satọde 7 Nọvemba 2026 merie mba Japan ma bụrụ mba mbụ n'Africa na-ebute iko asọmpi Fifa U17 Women's World Cup 2026.

Nigeria ji goolu abụọ a satara otu merie Japan n'asọmpi ikpeazụ ahụ nke kpọtụrụ n'ama egwuregwu Mohammed VI Footbal Academy complex dị na Rabat Morocco.

Mmeri a bụ nke ọtụtụ ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị kọwara dịka nnukwu ihe pụrụiche dịka ha toro otu egwu Flamingos nakwa ndị nkụzi ha maka mbọ ha gbara ibute iko ahụ.

Nke a bụ iko mbaụwa nke mbụ otu bọọlụ Flamingos na-ebute.

N'agbanyeghị na mba Poland meriri Nigeria n'asọmpi mbụ ha n'asọmpi U17 Women's World Cup, otu egwubọọlụ Flamingos Nigeria kwechiiri ma foro ntutu taa ma merie asọmpi ndị ọzọ niile ha nwere ma bute iko a.

Awawu Bashiru na Oluebube Umejiaku bụ ndị nwetara Nigeria goolu abụọ ha na asọmpi a.

Nwunye Onyeisiala Bola Tinubu bụ Oluremi Tinubu toro Flamingos Nigeria maka mmeri a ma kwuo na nke a egosila na Nigeria bụ a kwaa a kwụrụ n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n'Africa.

Oluremi Tinubu tokwara ndị nkụzi Flamingos maka ọrụ ha nke mere ka mmeri a dị ire.

Cheta na Flamingos mba Nigeria meriri Germany ma gbaa ndị nke atọ n'asọmpi Fifa U17 World Cup n'afọ 2022 nke a sọrọ na mba India.