Nyesom Wike ọ dara iwu ịzụ vootu na nkwa o kwere ndị 'councillor'?
Nnukwu ndọrịtaụka na-aga n'ihu ugbua na soshal midia Nigeria gbasara nkwa Minista na-ahụ maka isi obodo Abuja bụ Nyesom Wike kwere inye ndị 'cọuncillọr' okpuru ọchịchị ọbụla, Onyeisiala Bola Tinubu ga-enweta mmeri na 'ward' ya, onyinye nde naịra iri,
Nke a emeela ka ọtụtụ mmadụ na-ajụ sị, ọ bụ na nkwa dị etu a abụghị ịzụ vootu?
Mana gịnị ka iwu kwuru?
Ngalaba 22(c) nke iwu ntuliaka Naịjirịa bekee kpọrọ 'Electoral Act' kwuru sị: "Onye ọbụla zụrụ ree, maọbụ kwuo na ya ga-azụ maọbụ ree vootu, ma o mere ya n'ike onwe ya maọbụ n'aha onye ọzọ, dara iwu". Ntaramahụhụ ya bụ ịkwụ nha nde naịra ise maọbụ ịga mkpọrọ afọ abụọ, maọbụ ha abụọ.
N'aka nke ọzọ, ngalaba otu narị na iri abụọ na ise nke iwu ntuliaka machibidokwara nrụrụaka na inye ngarị n'oge ntuliaka.
Ihe ya bụ ngalaba machiri gụnyere mmadụ ịnye onyinye ọbụla, ego mgbazinye, ikwe nkwa, maọbụ inwe nkwekọrịta, iji mee onye ọzọ akpịrị ogologo ka o wee tụnyere maọbụ mee ka ndị mmadụ tụnyere onye na-azọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa.
Lee kpomkwem ihe akụkụ (d) nke ngalaba a kwuru: "Ọ bụrụ na e mechaa ntuliaka, onye ọbụla gara n'onwe ya maọbụ site n'aka onye ọzọ nara ego maọbụ ihe ọbụla gbara ọkpụrụkpụ n'ihi na ọ tụnyere maọbụ na ọ tụnyereghị, maọbụ na o mere ka onye ọzọ tụnyere maọbụ ghara ịtụnyere onye ọbụla na-azọ ọkwa vootu, dara iwu."
Ntaramahụhụ ya bụ nha nde naịra abụọ maọbụ ịga mkpọrọ otu afọ, maọbụ ha abụọ.
Otu onye ọkaiwu a ma ama na Naijiria bu Inibehe Effiong gwara BBC News Igbo na ikwe mmadụ nkwa ego iji nweta mmeri na ntuliaaka, dika Minista Wike mere, ezighi ezi n'iwu.
Onye Ọkaiwu ozo na-achoghi ka anyi kpoo aha ya kwukwara na ịtụ vootu n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya kwesịrị ịbụ ihe si mmadụ n'obi pụta, ọ bụghị ihe a na-eme n'ihi nkwa inweta egọ maọbụ ihe nrite dị icheiche.



