Ọtụtụ ụmụnwoke ekwetaghị na m ga-emenwu ihe ndị m na-eme - Favour Kelechi Okoh

Aha onyonyo, Ọtụtụ ụmụnwoke ekwetaghị na m ga-emenwu ihe ndị m na-eme - Favour Kelechi Okoh
Ọtụtụ ụmụnwoke ekwetaghị na m ga-emenwu ihe ndị m na-eme - Favour Kelechi Okoh
Mgbe e biputara ya

Favour Kelechi Okoh bụ nwaagbọghọ nwere akaraka dị iche iche gụnyere ịkụ igba, ịnya igwe nwere otu ụkwụ na ịtụ ‘juggling’ bụ ụfọdụ e cheere bụ nke naanị ụmụnwoke na-emenwu.

Okoh, onye na-akụ igba kamgbe ihe karịrị afọ iri, kwuru na ụfọdụ ụmụnwoke anaghị ekweta na ụmụnwaanyị nwekwara ike ịkụ egwu, ọkachasị n'ụlọụka.

O kwuru na ọ na-ezutekarị ụdị obi abụọ a mgbe ọ na-aga ime njikere ịkụ egwu, ebe ọ na-abụkaarị naanị ya bụ nwaanyị n'etiti ndị na-akụ egwu.

Ọ bụkwa onye guzobere ụlọ ọzụzụ Kelechi Unicycle Academy, nke a maara dịka 'K Circus', ebe ọ na-azụ ụmụaka nka ịkụ egwu na ịme ihe nkiri circus.

Ndụmọdụ ya nye ụmụagbọghọ bụ ka ha ghara ikwe ka echiche ndị mmadụ gbochie ha imezu ebumnuche ha.