Ihe anyị ma maka ụmụakwụkwọ a sị nwụrụ na mahadum University of Nigeria Nsukka

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kemgbe abalị garaaga ka akụkọ na-efegharị na ụmụakwụkwọ na-agụ 'Pharmacy' na University of Nigeria Nsukka (UNN) nwụrụ ka ha mechara oriri na nkwari.

Akụkọ ahụ na-efesasị na social midịa na-ekwu na ndị nwụrụ ruru mmadụ asaa yana ha bụ ụmụakwụkwọ na-agụ Pharmacy na mahadum UNN.

Ọzọ bụ na ọdachi ahụ mere n'oge ụmụakwụkwọ ahụ mere oriri na nkwari maka na ha agụchaala akwụkwọ.

Akụkọ na-ekwu na ndị ahụ nwụrụ ka ha mechara oriri n'ime abalị mana ka chi foro ihe ruru mmadụ asaa n'ime ha tọgbọrọ n'ozu.

Mana n'ozi otu jikọrọ ụmụakwụkwọ Pharmacy na mahadum UNN bụ 'Pharmaceutical Association of Nigeria Students (PANS) wepụtara ka ha kọwara na ndị ahụ abụghị ụmụakwụkwọ na-agụ 'Pharmacy' na mahadum UNN.

Ha gara n'ihu kwuo na ihe ahụ mere n'ebe a na-akpọ 'End in Praise Lodge, Hilltop, dị na Nsukka, Enugu state.

N'akwụkwọ ozi nke onyeisi otu ụmụakwụkwọ ahụ bụ Onah Olisaemeka na odeakwụkwọ ya bụ Obasi Chibuike binyereaka, ka ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Maduadizie Gregory kwuru na ha gara njem nleta n'ụlọọgwụ Faith Foundation Hospital ebe e dobere ozu ndị nwụrụ anwụ bụ ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị abụọ n'ọba ozu, iji chọpụta nke bụ eziokwu.

O kwuru na ha lechara ndị ahụ nwụrụ anwụ anya mana onweghị onye n'ime ha bụ ụmụakwụkwọ ngalaba Pharmacy so na ndị nwụrụ anwụ.

"Nnoycha m mere maka ndị ihe ọjọọ ahụ metụtara, gosiri mmadụ abụọ ndị a ma ama n'akara soshal midịa nke mahadum UNN, bụ ndị a maara dịka Rymez, onye na-eme onyonyoo n'okporoụzọ yana Golden bụkwa na-eme ihe ngosi ịgba egwu na soshal midịa," ka o kwuru.

O gara n'ihu kwuo na ghọtara nchegbu akụkọ ọjọọ na-enwe na ndụ ndị ezinaụlọ, ndị enyi and ụmụakwụkwọ mahadum ahụ.

O nyere ndị mmadụ ndụmọdụ maka ibelata ibughara akụkọ ụghba, ma kwuo na ha ga-agba mbọ iji ahụ na ha gbasara ozi ha chọpụtara banyere ọnwụ mmadụ asaa ahụ.