Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
'Netizens' enyela Mama Uwa onyinye: Ihe anyị ma maka akụkọ Mama Ukehe
- Onye dere ya, Michael Ngene na Donald Wogu
- Mgbe e biputara ya
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Dịka akụkọ banyere Gertrude Ngwu bụ nwaanyị ahụ ihe onyonyo ya fesara oge di ya bụ Jonas Eloke chiri echichi n'obodo ha Ukehe dị n'Enugu state, ọtụtụ mmadụ amalitela inye nwaanyị ahụ ọtụtụ onyinye dị iche iche gụnyere akwa, ego, nri nakwa ihe ndị ọzọ.
Mana iji chọpụta ihe ndị ọzọ dị n'ime akụkọ a, BBC News Igbo gara n'obodo Ukehe iji gbaa Gertrude Ngwu, di ya Jonas Eloke na nwunye nke abụọ di ya bụ Chinweokwu Eloke ajụjụọnụ.
Oge anyị rutere n'ụlọ nna Gertrude n'ụbọchị Fraịde 6 Nọvemba 2026, anyị hụụ ọtụtụ ndị mmadụ jupụtara n'ụlọ ya.
Anyị hụkwara ọtụụ onyinye dị iche iche ndị mmadụ wetara ya nakwa ndị otiegwu 'ogene' na-eti egwu iji mee ndị mmadụ obi ụtọ.
Oge anyị gbara Gertrude ajụjụọnụ, ọ gwara anyị na ya na di ya lụrụ n'afọ 1986 ma kwuo na ha abụọ na-ebi n'udo dịka ha lụụ.
"Oge mụ na ya na-alụ, anyị nọ ọfụma. Anyị amụtaghị nwa ruo otu afọ, mana anyị na-ebu n'udo. Ọ bụ oge di m lụtara nwaanyị nke abụọ ọ lụrụ ka anyị malitere inwe esemokwu."
Ọ gara n'ihu kwuo na ya na di ya gara n'ụlọọgwụ ebe e nyere ha ọgwụ mana o kwuru na na di ya bụ Jonas kwụsịrị ịṅụ nke ya. Ọ kọwara na di ya agwaghị ya oge o kpebiri ịlụ nwaanyị ọzọ ma
"Ngwangwa o kpebiri ịlụ nwaanyị ọzọ, ọ gwaghị m. Ọgwụ a na-enye anyị maka ịmụ nwa, ọ kwụsịrị ịṅụ ya. Ana m aṅụ nke m dịka anyị na-ebi."
Na nzaghachi, Jonas Eloke gwara anyị na, "E nwere ọgwụ e nyere anyị mana anyị na-aṅụ ya. Enweghị oge ọbụla m kwụsịrị ịṅụ ya. Akwụsịrị ịṅụ ya ebe m na-achọ nwa? Onye Igbo ọbụla anaghị anọ ka obi be nna ya chie. Ana m agwa ya ka anyị chọọ nwaanyị ọzọ lụta maka na mụ na gị anụọla afọ itoolu tinyekwara na abụ m naanị nwoke nna mụrụ. Ọ gwara m na oge erubeghị."
Ọ gara n'ihu kwuo, "Alaghachiri ebe m bi. Alaghachitere m gwakwa ya ọzọ, mana ọ sara ihe ahụ ọzọ. Oge m gwara ya nke ugboro atọ, amalitela ịchọ nwaanyị m ga-alụ ma hụ onye nke a. . Ekwuru m na agaghị agwa ya n'oge maka na m gwa ya n'oge, o nwereike ịghasa ya," ka ọ gwara anyị.
Mazị Jonas kọwara na ọ jụrụ nwunye ya ihe na-eme dịka ha nọrọ otu afọ na-amụtaghị nwa ma kọwakwaa eti ha si gaa n'ụlọọgwụ iji mee nnyocha iji chọpụta ihe na-egbochi ha ịmụta nwa nke ha.
"Anyị nọrọ ihe dịka otu afọ mana ọ tụghị ime. Agwara m ya kedụ ihe na-eme? Ọ gwara na ya achọbeghị ịmụ nwa ugbua. E nwere oge ọ ruru, ọ gwa m na ya chọrọ ịmụ nwa. Mbọ niile anyị gbara ruo ọtụtụ afọ amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Agwara m ya ka anyị ga mee nnyocha n'ụlọọgwụ. Ihe e dere ma mpụtara nnyocha anyị mere bụ na 'Echere m na e wepụrụ nwa n'ike na nso nso a'. Amaghị na oge ahụ mụ na nọ, ọ na-atụrụ ime ma wepụ ya."
Mazị Jonas kọwara na ọ jụrụ nwunye ya ihe na-eme dịka ha nọrọ otu afọ na-amụtaghị nwa ma kọwakwaa eti ha si gaa n'ụlọọgwụ iji mee nnyocha iji chọpụta ihe na-egbochi ha ịmụta nwa nke ha.
"Anyị nọrọ ihe dịka otu afọ mana ọ tụghị ime. Agwara m ya kedụ ihe na-eme? Ọ gwara na ya achọbeghị ịmụ nwa ugbua. E nwere oge ọ ruru, ọ gwa m na ya chọrọ ịmụ nwa. Mbọ niile anyị gbara ruo ọtụtụ afọ amịtaghị mkpụrụ ọbụla. Agwara m ya ka anyị ga mee nnyocha n'ụlọọgwụ. Ihe e dere ma mpụtara nnyocha anyị mere bụ na 'Echere m na e wepụrụ nwa n'ike na nso nso a'. Amaghị na oge ahụ mụ na nọ, ọ na-atụrụ ime ma wepụ ya."
Maka akụkọ kwuru na Chinweokwu Eloke bụ nwunye nke abụọ Jonas lụrụ nke mụtaara ya ụmụaka asatọ na ụmụaka na-akọ Gertrude ọnụ maka na ọ mụtaghị nwa, Chinweokwu Eloke gwara BBC na enweghị oge ọbụla ya onwe ya maọbụ ụmụaka ya kọrọ Gertrude ọnụ maka na ọ mụtaghị nwa.
Chinweokwu ṅụrụ iyi na enweghị oge ọbụla ihe dị etu a mere
N'okwu ya, "Otu onye bịa chinye m aja n'aka. Achọrọ ịchịrị aja n'aka ma m na-ekwu ihe a. Ebe ọbụla m nọ gwujọọ, eluigwe na ala mee m ihe ọbụla masịrị ha. Enweghị oge ọbụla m kọrọ nwaanyị a ọnụ na ọ mụtaghị nwa".
Di ha bụ Jonas kwukwara na enweghị oge ọbụla o nwetara mkpesa ọbụla banyere na a na-akọ Gertrude ọnụ.
"Anụbeghi maka nke ahụ. Ọ gwabeghị na a na-akọ ya ọnụ maka na ọ mụtaghị nwa."
Gertrude kọwara na enweghị oge ọbụla di gwara ya pụọ n'ụlọ ha.
"Eji m aka pụọ maka na aga m anọ otu izuụka enweghị onye ga-akwa m okwu. Enweghị ihe na-eme m oge mana echiche malitere igbu m. Ọ bụ ya mere m ji lọta ebe a.