Gịnị mere David Umahi na Cubana Chiefpriest ji adụ onwe ha aka n'ọnụ?

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi na Pascal Okechukwu onye e ji Cubana Chiefpriest maara abụrụla okwu a kpụ n'ọnụ ugbua n'ihi okwu ha abụọ na-atụpụrụ ọnwe ha na nso nso a.

Onweghi onye maara kpọmkwem ihe malitere maọbụ ihe bụ isi esemokwu mmadụ abụọ a.

Mana n'oge gara aga, n'ọnwa Sepụtemba afọ 2026 Cubana Chiefpriest wepụtara ozi n'akara Instagram ebe ọ nọrọ katọọ David Umahi ma boo ya ebubbo na ọ rụghị ọrụ pụtara ihe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria dịka mịnịsta ọrụ.

N'ozi ahụ o wepụtara, Cubana Chiefpriest kwuru na David Umahi so na mịnịsta kachasị njọ si na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeiria ma kpọọ oku ka Onyeisiala Bola Tinubu gbanwee David Umahi dịka mịnịsta ọrụ.

O kwuru na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na David Umahi na-akwado nwa ya nwoke ka ọ bụrụ Gọvanọ Ebonyi state n'ọdịnihu ma kwuo na nke bụ ihe kwesịtị ka e gbochie ya.

Dịka Cubana Chiefpriest kwuchara ihe ndị a, David Umahi azaghị ya kamgbe ahụ rute n'ọnwa Nọvemba ka o kpebiri ịtụpụrụ ya ọnụ.

Na nzaghachị, David Umahi bụbu Gọvanọ Ebonyi state katọrọ okwu Cubana Chiefpriest ma kwuo na ya aghọtaghị ihe mere Cubana Chiefpriest ji eti 'money na water' oge niile ma jụọ ya ego ole ka o ji nakwa mmadụ ole o nyeere aka.

Umahi gara n'ihu kwuo na Chiefpriest bụ onye na-eme oke mkpọtụ ma gwa ya ka o jiri ego ahụ o chere na o nwere kwadoo ma nyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka.

N'okwu ya "Ị hụla ebe Dangote, Otedola nakwa BUA na-ekwu na ha nwere ego?, ego na-ekwuru onwe ya."

Ọ jụrụ Chiefpries ka ọ bụ maka ntakịrị ụlọọrụ a na-aṅụ mmaya o nwere mere o ji eti 'money na water' ma jụkwaa ya mmadụ ole o nyerela aka nakwa ndị o nyere agụmakwụkwọ n'efu.

David Umahi na Cubana Chiepriest bụ ndị otu pati All Progressive Congress (APC) ma bụrụkwa ndị na-akwado Onyeisiala Bola Tinubu na ntuliaka 2027.

Umahi bụbu Gọvanọ Ebonyi state ebe Chiefpriest bụ onye Imo state ma bụrụ onye ji ego echụ ego.

N'agbanyeghị na ha abụọ nọ n'otu pati, ha na akwado ndị dị iche iche maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ebonyi state n'afọ 2027.

Umahi na-akwado Francis Nwifuru nke APC ebe Chiefpriest na-akwado Ifeanyi Odii nke pati Peoples Democratic Party (PDP).

N'oge gara aga, Chiefpriest katọrọ Gọvanọ Nwifuru ma kọwaa ya dịka gọvana na-enweghị ihe ọbụla ọ na-arụ nke mere o jiri kpebie ịkwado Ifeanyi Odii nke pati PDP.

N'aka nke ọzọ, Umahi emeela ka o doo anya na Gọvanọ Nwifuru ga-enweta mmeri nke ugboro abụọ dịka gọvanọ n'ihi na 'ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dịka gọvanọ'.