Ndị meriri n'asọmpi nke Fifa U17 Women's World Cup alaghachila Nigeria

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị otu egwuregwu bọọlụ ụmụ agbọghọ Naịjirịa, ndị a maara dịka Flamingos, alọtala Abuja ka ha nwetasịrị mmeri n'asọmpi Iko Mba Ụwa nke FIFA nke ụmụ agbọghọ na-erubeghị afọ iri na asaa.

Ndị Flamingos meriri Japan goolu 2-1 n'egwuregwu ikpeazụ e mere na Satọdee, si otu a nweta iko ahụ nke mbụ n'akụkọ ihe mere eme.

Awawu Bashiru na Oluebube Umejiaku bụ ndị nyere goolu abụọ ahụ mere ka Naịjirịa merie ma bụrụkwa mba Afrịka mbụ ga-ebuli iko asọmpi a.

Ndị ọrụ otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa (NFF) na ụfọdụ ndị na-akwado otu egwuregwu ahụ nabatara ndị mmeri a n'ọdụ ụgbọelu mba ụwa nke Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja, mgbe ụgbọelu ha rutere n'isi ụtụtụ.

Mmeri a bụ nnukwu ihe ịga nke ọma ọzọ nye otu egwuregwu Flamingos, bụ́ ndị gosipụtarala na ha so n'òtù egwuregwu bọọlụ ụmụ agbọghọ kacha sie ike n'Afrịka.

Tupu ha aga Morocco maka asọmpi Iko Mba Ụwa, Flamingos emeriela iko WAFU-B nke afọ 2026 maka ụmụ agbọghọ na-erubeghị afọ iri na asaa, bụ́ nke e mere na Côte d'Ivoire.

Ha meriri egwuregwu ise niile ha gbara n'asọmpi ahụ, gbaa goolu iri na asaa, ebe otu goolu ka a gbara ha.

'Mmeri Flamingos abụghị nke chi nyere ha na mberede'

Onye nchịkwa Flamingos, Hakeem Busari, etoola ndị egwuregwu ya maka ịnagide ihe isi ike, ịgbaso atụmatụ egwuregwu na ịgbasi mbọ ike ruo na njedebe asọmpi Iko Mba Ụwa nke FIFA.

O kwukwara na ihe ndị otu egwuregwu Afrịka gosipụtara n'asọmpi ahụ na-enye olileanya maka ọdịnihu egwuregwu bọọlụ n'Afrịka.

N'ajụjụ ọnụ a gbara ya mgbe egwuregwu ikpeazụ gasịrị, Busari kwuru na arụmọrụ ndị otu Afrịka gosipụtara etu egwuregwu bọọlụ ụmụ agbọghọ si na-aga n'ihu, nakwa etu ndị egwuregwu si enwekwu ike ịsọ mpi n'agbanyeghị ndị mmegide siri ike ha na-ezute.

O kwuru na Flamingos sonyere n'òtù egwuregwu siri ike n'asọmpi ahụ, nke gụnyere ndị meriri iko ahụ n'afọ gara aga. Dịka o si kwuo, ahụmịhe ha n'asọmpi ahụ gosiri ọganihu a na-enwe n'ịzụlite egwuregwu bọọlụ ụmụ agbọghọ n'Afrịka.

O kwuru, sị: "Ihe anyị na-ahụ ugbu a abụghị ihe mere na mberede. Ọ bụ n'ihi mmepe, nkwụsi ike na agwa ọma ndị egwuregwu, tinyere ịgbasi mbọ ike site na mmalite iji mee ka ihe gaa nke ọma. Ya mere, obi dị anyị ezigbo ụtọ."

Onye nchịkwa ahụ kwukwara na ya nwere olileanya na n'asọmpi ndị na-abịa n'ihu, ọtụtụ ndị otu egwuregwu si Afrịka ga-enwe ike ịgafe agba egwuregwu mwepụ, rute n'ọgwụgwụ asọmpi ma merie iko ahụ.

Mgbe ọ na-akọwa etu ha siri merie Japan, Busari kwuru na ndị otu ya nyochara ike ndị Japan, ọkachasị n'ịchịkọta bọọlụ na-alọghachi n'aka ndị mmegide nakwa iji ohere dị n'azụ ndị na-agbachitere goolu emegide ha.

O kwuru na ndị ọrụ na-ahụ maka atụmatụ egwuregwu Flamingos gbanwere ụzọ ha si agba bọọlụ iji belata ohere ndị Japan nwere iji wakpo ha. Nke a gụnyere ịgba bọọlụ ogologo n'ebe ndị Japan na-agaghị enwe ike ịchịkọta ya ngwa ngwa.

Busari kọwara na mmalite egwuregwu ahụ, Flamingos chọrọ ịgbata goolu n'oge. Ma mgbe ha butere ụzọ, ha gbanwere atụmatụ ha, malite ịkpachapụ anya n'egwuregwu ahụ.

Otú ọ dị, Japan mechara nweta goolu ha ji tọọ akara tupu e mechie egwuregwu ahụ site n'otu bọọlụ e nyere n'usoro egwuregwu a haziri ahazi.

O kwuru na egwuregwu ahụ bụ ọgụ atụmatụ n'etiti ndị otu abụọ, nke chọrọ ka ndị egwuregwu Flamingos jikọta aka n'ịgbachitere onwe ha, gbasoo ntụziaka onye nchịkwa ma mara etu a ga-esi chịkwaa egwuregwu ahụ ruo na njedebe.