Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Nyesom Wike a dara iwu Nigeria gbasara ịzụ vootu?
Minista na-ahụ maka Federal Capital Territory (FCT) bụ Nyesom Wike ekweela ndị 'councillor' okpuru ọchịchị dị icheiche nkwa inye otu onye n'ime ha nde naịra iri (10m) ma ọ bụrụ na Onyeisiala Bola Tinubu nweta mmeri na 'ward' ha dị icheiche na ntuliaka 2027.
Nke a akpalitela ajụjụ nakwa ịrụ ụka ndọrọndọrọ gbasara ihe iwu Nigeria kwuru maka mmadụ iji ego azụta vootu.
Wike kwere nkwa ahụ na nzukọ ndị otu 'Rainbow Coalition' n'okpuru ọchịchị Kwali nke dị n'isi obodo Abuja nwere n'ụbọchị Mọnde, iji jalite mmụọ ndị 'councillor' ka ha gaa kpọtụrụ ndị isi obodo, ndị ntoroọbịa na otu dị iche iche iji hụ na ha nwetaara Tinubu mmeri.
O kwuru, sị: "Onye kansụl ọ bụla ga-eme ka Tinubu nweta merie na mpaghara 'ward' ya, ga-enweta nde naịra iri dịka ụgwọ ọrụ."
Ọtụtụ na-ekwu na nkwa dị otu a megidere iwu ntuliaka, ebe ndị ọzọ na-ekwu na Wike adaghị iwu ọbụla.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Gịnị ka iwu ntuliaka Nigeria kwuru?
Ngalaba 22(c) nke iwu ntuliaka Naịjirịa bekee kpọrọ 'Electoral Act' kwuru sị: "Onye ọbụla zụrụ maọbụ ree, maọbụ kwuo na ya ga-azụ maọbụ ree vootu, ma o mere ya n'ike onwe ya maọbụ n'aha onye ọzọ, dara iwu".
Ntaramahụhụ maka ịda iwu a bụ ịkwụ nha nde naịra ise maọbụ ịga mkpọrọ afọ abụọ, maọbụ ha abụọ. Onye ahụ agaghịkwa enwe ike ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla na Nigeria ruo opekatampe afọ iri.
N'aka nke ọzọ, ngalaba 125 nke iwu ntuliaka kwuru gbasara nrụrụaka na inye ngarị n'oge ntuliaka.
Ngalaba a machiri mmadụ ịnye onyinye ọbụla, ego mgbazinye, nkwa, maọbụ nkwekọrịta, iji mee onye ọzọ akpịrị ogologo ka o wee tụnyere maọbụ mee ka ndị mmadụ tụnyere onye na-azọ ọkwa ọchịchị na Naịjirịa.
Akụkụ (d) nke ngalaba 125 nke iwu ntuliaka kwuru sị: "E mechaa ntuliaka, onye ọbụla gara n'onwe ya maọbụ site n'aka onye ọzọ nara ego maọbụ ihe ọbụla gbara ọkpụrụkpụ n'ihi na ọ tụnyere maọbụ na ọ tụnyereghị, maọbụ na o mere ka onye ọzọ tụnyere maọbụ ghara ịtụnyere onye ọbụla na-azọ ọkwa vootu, dara iwu."
Ọ bụrụ na ụlọikpe maa onye dị otu a ikpe, ntaramahụhụ ya ga-abụ nha nde naịra abụọ maọbụ ịga mkpọrọ otu afọ, maọbụ ha abụọ.
Ihe ndị ọkaiwu kwuru
Otu onye ọkaiwu, Inibehe Effiong, gwara BBC News okwu gbasara nke a kwuru na nkwa a Nyesom Wike kwere n'ihu ụwa nille adabaghị adaba n'ezi agwa nakwa n'iwu.
"Ihe Minista Wike mere bụ ịchọ ụzọ ịzụrụ vootu ụmụ Naịjirịa site n'enyemaka nakwa nkwado ndị 'councilors'," Ọkaiwu Effion kwuru.
Onye ọkaiwu ọzọ rịọrọ ka anyị ghara ịkpọpụta aha ya kwukwara sị, "ya bụ ihe bụ ịzụ vootu, onweghị ihe ọzọ a ga-akpọ ya".
"Nke a nwere ike ime ka ndị 'concillior' nille malite ime ihe dị icheiche, tinyere nrụrụaka nakwa iji aka ike, iji hụ na onyeisiala meriri na 'ward' ha, ka ha wee rite ya bụ nde naịra iri," ọkaiwu ahụ kwuru.
Ọ rụtụrụ aka n'ihe mere na ntuliaka ndị omeiwu e mere na mba America n'ọdịnso a, etu onyeisiala America bụ Donald Trump si kwe nkwa inye ndị mmadụ puku dọla ise ($5,000) ma ọ bụrụ na ndị pati ya bụ 'Republican' emerie n'ụlọ omeiwu Sineti nakwa n'ụlọomeiwu nta bụ 'House of Representatives'.
Ọkaiwu a kwukwara na ịtụ vootu n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya kwesịrị ịbụ ihe si mmadụ n'obi pụta, ọ bụghị ihe a na-eme n'ihi nkwa inweta egọ maọbụ ihe nrite dị icheiche.
Ihe ụmụ Nigeria na-ekwu na soshal midịa
Ọtụtụ ụmụ Nigeria kwuru na ụlọọrụ gọọmenti na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka kwesịrị ilebanye anya n'okwu a Nyesom Wike kwuru n'ihi na o megidere iwu.
Ndị ọzọ kwuru na nke a egosila na Wike na-atụ egwu na onyeisiala Tinubu nwere ike ịda na ntuliaka afọ 2027, mana ụfọdụ ndị ọzọ kwuru na onweghị ihe ọjọọ Wike kwuru.
Otu onye aha ya bụ 'SportsDokita' kwuru na X, dere sị na Rivers state nwere ọnụọgụgụ ndị 'councillor' dị 319. Ọ bụru na ha niile merichaa 'ward' ha, ọ pụtara na Wike ga-enye ha niile ijeri naịra atọ na ụma (N3.19 billon).
"Ọ bụrụ na ụlọọrụ EFCC na-arụ ọrụ ha nke ọma, ha kwesịrị ilebanye anya n'okwu a," ka o dere.
Onye ọzọ aha ya bụ Moses Paul, bụkwa onye a ma ama na-akwado onye bụbu gọvanọ Anambra Steeti bụ Peter Obi, dere sị:
"Democracy abụghị ụlọahịa. Ike ọchịchị nke ndị mmadụ abụghị ihe e ji atụ mgbere ahịa. Onweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla nwere ikike ịzụrụ akọnuch maọbụ ike vootu ụmụ Nigeria.
Mana onyeisi otu All Progressives Congress bụ Nentawe Yilwatda, kwuru na Wike adaghị iwu ọbụla, o nyeghị onye ọbụla ego ijụ zụrụ vootu ha, kama ihe o mere bụ ịjalite ndị otu pati ha ka onye ọbụla n'ime ha gbasie mbọ ike ịhụ na onyeisiala Tinubu nwetara mmeri.