Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Etu Nigeria, Senegal, South Africa, Ghana na mba ndị ọzọ ga-esi sọọ mpi maka itozuoke n'egwuregwu Afcon 2027
Dịka asọmpi itozu isonye n'egwuregwu African Cup of Nations (Afcon) nke afọ 2027 ga-akpọtụ n'izuụka a, ọtụtụ mba dị iche iche ga-ezute onwe n'Africa.
Ụfọdụ mba ga-ezute onwe ha n'izuụka a iji nweta akara ga-enyere ha aka tozue isonye n'asọmpi Afcon 2027.
E nwere ọtụtụ asọmpi ndị asọmpi egwuregwu na-amasị na-elegara anya.
Mba South Africa ga-ezute Kenya n'ama egwuregwu Orlando Stadium dị na Johannesburg n'ụbọchị Fraịde 13 Nọvemba 2026 dịka ha na-atụ anya ịga n'ihu n'ike na ebube ha ji malite asọmpi ntozu a.
Na-agbanyeghị na Kenya etozuola isonye n'asọmpi a maka na ha so na mba na-ahazi ya, ọ bụ naanị otu ohere fọdụrụ na otu nke D nke ha nọ n'ime ya.
South Africa emeriela asọmpi abụọ mbụ ha.
Senegal vs Sudan
Mba Senegal na Sudan ga-achịpụ ya n'ama egwuregwu Stade Leopold Sedar Senghor na Dakar.
Senegal emeriela otu asọmpi n'ime asọmpi abụọ mbụ ha ma gbaa onye lawa onye lawa n'otu asọmpi. Ọ bụ naanị goolu abụọ ka ha nwetara na asọmpi ndị a.
Ghana vs Somalia
Mba Ghana agbaala ọnyụpa n'asọmpi abụọ mbụ ha. Ọ bụ mba Côte d'Ivoire na mba Gambia meriri ha.
Dịka ha ga-ezute mba Somalia n'ụbọchị Tọzde 12 Nọvemba 2026, ha na-atụ anya inweta mmeri iji mara ka ihu ọma a ga-akpọ ha.
Mohammed Kudus, Thomas Partey, Jonas Adjetey, Jordan Ayew na Mohammed Salisu alọghachitela n'otu egwu bọọlụ mba Ghana.
Nigeria vs Tanzania
Nigeria ga-ezute Tanzania n'ama egwuregwu Godswill Akpabio International Stadium dị n'Uyo dịka ha na-atụ anya inweta mmeri iji hụ na ha nwere ohere itozu isonye n'asọmpi Afcon 2027.
Nigeria, Tanzania, Guinea-Bissau na Madagascar nọ n'otu L.
Nigeria na-agba mbọ ịhụ na ha nwetara mmeri maka na Tanzania etozuola isonye n'asọmpi a maka na ha so na mba atọ n'chịkọba ya.
Nigeria agbaala asọmpi abụọ, merie otu ma kpụọ afọ n'ala n'otu.
Ebe a ga-anọ sọ asọmpi Afcon 2027
Mba Kenya, Tanzania na Uganda bụ mba atọ ga-achịkọba asọmpi Afcon 2027 malite na Juun 19 ruo Julaị 17 afọ 2027.
Nke a bụ oge mbụ mba atọ ha-achịkọba asọmpi Afcon ma bụrụkwa oge mbụ a ga-agba asọmpi Afcon na mpaghara ọwụwa anyanwụ Africa kemgbe afọ 1976.
Ama egwuregwu a ga-anọ sọọ asọmpi a na Kenya gụnyere Talanta Sports Stadium dị na Nairobi na Moi International Sports Centre nke dị na Kasarani
Na Tanzania, ọ bụ n'ama egwuregwu Benjamin Mkapa Stadium dị na Dar es Salaam, Samia Suluhu Hassan Stadium dị n'Arusha, nakwa Fumba/Maisara Sports Complex.
Ama egwuregwu Mandela National Stadium nke a maara dịka Namboole dị na Kampala, Hoima City Stadium nakwa Akii-Bua Olympic Stadium dị na Lira ka a ga-anọ sọọ asọmpi Afcon namba Uganda.