Gịnị bụ ntuliaka nnwale 'mock' INEC ga-eme maka nhọpụta Onyeisiala n'afọ 2027?

Ebe foto si, INEC/Fcaebook
Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Nigeria bụ Independent National Electoral Commission (INEC) enyela nkọwa etu ha ga-esi eme ntuliaka nnwale bekee kpọrọ 'Presidential Mock Election' maka nhọpụta Onyeisiala n'afọ 2027.
Cheta na onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Amupitan kwuputara na ha na-akwado ime ntuliaka nnwale n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Nọvemba 2026 mana igwe mmadụ na-ajụ kedụ usoro ha ga-esi eme nke a.
Mohammed Kidu Haruna kọwara ntuliaka nnwale usoro nhọpụta Onyeisiala dịka ihe a na-eme iji mara ọnọdụ akụrụngwa niile ụlọọrụ INEC ji arụ ọrụ.
Mohammed Kidu Haruna kwuru sị "dịka aha ya si dị, nke a bụ nnwale, ọbụghị ezigbo ntuliaka".
"Adịghị eji ezigbo otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị eme nnwale ahụ, maọbụ jiri aha ha eme ya".
Ọ gara n'ihu kwuo na ntuliaka niile INEC haziri kemgbe afọ 2023 na state dị iche iche na ha na-eme ntuliaka nnwale mana ntuliaka nhọpụta Onyeisiala bụ nke ha chọrọ ime na mpaghara dị icheiche na Nigeria.
Kedụ usoro a ga-eji eme ntuliaka nnwale ahụ?

Ebe foto si, INEC/Facebook
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ INEC bụ Mohammed Kidu Haruna kọwara etu ụlọọrụ ahụ ga-esi eme ntuliaka ahụ oge BBC kpọtụrụ ya n'ekwentị ma gbaa ya ajụjụ ọnụ maka atụmatụ ahụ nakwa ajụjụ dị icheiche ndị mmadụ na-ajụ maka ya.
Haruna zara ajụjụ ahụ ma kọwaa uru ọ bara n'usoro ntuliaka na Nigeria.
O kọwara etu ụlọọrụ INEC ga-esi eme ntuliaka nnwale maka nhọpụta Onyeisiala 2027.
Mohammed Kidu Haruna gwara BBC sị "n'ụbọchị ahụ, aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ị ga-ahụ agaghị abụ aha ndị ị ma. Ọ ga-abụ aha e mepụtara maka naanị ntuliaka nnwale ahụ".
"N'ọnụ ama ebe a na-atụ vootu, ndị mmadụ ga-enwete akwụkwọ ịtụ vootu, tinyere aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị e tinyere aha ha".

Ebe foto si, INEC/Facebook
E meela nke a n'oge garaaga?
Haruna kwuru sị, kemgbe afọ 2023 ruo ugbua, ntuliaka niile e megoro dịka ntuliaka Onyeisiala, nke Gọvanọ, ndị omeiwu nakwa ndị ọzọ dapụtara adapụta na ụlọọrụ INEC na-eme ntuliaka nnwale 'mock'.
Ọ kọwara na ọ bụ nnwale a ga-enyere ha aka ịmara ebe akụrụngwa ha na-eri mperi ma mezie ya.
































