Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Anyị na-agba mbọ ka Ekweremadu lọghachi ma mechaa mkpọrọ ya na Nigeria - Peter Mbah
Aka na-achị Enugu state bụ Peter Mbah ekwuola mbọ ha na-agba iji hụụ na onye omeiwu a ma ama bụ onye nọ n'ụlọmkpọrọ na mba United Kingdom maka ebubo ịzụ akụrụ mmadụ, lọghachite na Nigeria.
O kwuru na Sinetọ Ike Ekweremadu bụbu osote onyisi ụlọomeiwu Sịneti Nigeria ga-alọghachi iji mechaa nga ya mgbe na-adịghị anya.
Gọvanọ Mbah mere ka a mata nke a na mparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo ma kọwa mbọ ha na-agba ime ka Sinetọ Ike Ekweremadu pụta na nga.
Chete na a tụrụ Senetọ Ike Ekweremadu nga na mba England maka ebubo gbadoro ụkwụ "n'ịzụ maọbụ gba mbọ ebubo ịzụ akụrụ mmadụ bụ nke e kwuru na ọ bụ maka nwa ya nwaanyị nke nwere ọrịa akụrụ.
Mana Gọvanọ Peter Mbah na-akọwa ihe dubara Senetọ Ike Ekweremadu n'ụlọ nga dịka ihe ọgbataughe nke nwereike ịdakwasị nne na nna ọbụla.
N'okwu ya "Ọ bụrụ na ịmụbeghị nwa nke gị ịgaghị aghọtacha ihe nna ga-eme iji ịzọpụta maọbụ nyere nwa ya aka n'oge o nwere nsogbu ahuike"
"Ihe mere bụ ihe mgbanwaobi. Anyị na ya ka na-akpa. Anyị so na ndị na-agwa ndị na-achị Nigeria ka ha mara etu ha na mba England ga-esi mee ka Ekweremadu nọrọ na Nigeria nọzuo afọ ole a tụrụ ya nga ma ọ bụrụ na ha chọ na ọ ga-anọrịrị na nga. Anyị na-atụ anya na oge adịghị anya na ọ ga-apụta".
Amaghị m maka 'Peter Obi wave', ọ bụ 'APC wave' ka anyị nwere n'Enugu state – Gọvanọ Peter Mbah
Gọvanọ Enugu state bụ Peter Mbah ekwuola na ya amaghị ihe ọbụla a na-akpọ 'Peter Obi wave' na state ya ma kwuo na ọ bụ naanị 'APC wave' ka e nwere n'Enugu state.
Gọvanọ Peter Mbah kọwara na ihe mere o ji hapụ pati Peoples Democratic Party (PDP) ma banye pati All Progressives Congress (APC).
N'okwu ya, "Ihe mere anyị ji hapụ PDP bụ maka na o doro anyị anya na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụ ọrụ ga-ahụ maka ọdịmma ndị Enugu state, ọtụtụ nsogbu a na-enwe na pati ahụ agaghị enye anyị ohere ịrụ ya etu o kwesịrị".
Gọvanọ Mbah jikwa ohere ahụ nye ọsịsa banyere ebubo kwuru na ọ na-akpagbu otu ndọrọ ndọrọ ndị ọzọ a kpọrọ 'opposition' na Bekee na state ahụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Gịnị bụ 'Peter Obi wave' na ihe Gọvọnọ Peter Mbah kwuru maka ya?
Banyere okwu na 'Peter Obi wave' nke pụtara ihe na ntuliaka 2023 nwereike ime ọzọ na 2027, Gọvanọ Mbah kwuru na "amaghị m ihe ọbụla a kpọrọ 'Peter Obi wave', ọ bụ naanị 'APC wave' ka e nwere n'Enugu state".
Ọ gara n'ihu kwuo na pati ya bụ APC nwere mgbọrọgwụ nke Bekee kpọrọ 'structure' nakwa ndịisi n'ebe niile a na-atụ vootu na wọọdụ nakwa okpuru ọchịchị niile dị n'Enugu state.
"Enweghị ebe a na-atụ vootu anyị na-enweghị ndị otu anyị ọnụọgụgụ ha karịrị mmadụ iri asaa bụ ndị na-ahazị ihe n'ebe ahụ", ka o kwuru.
"Ọnụọgụgụ ndị pati anyị aha ha dị na ndekọ anyị ruru narị mmadụ ise n'Enugu state. Ọ bụrụ na ndị ahụ gaa chụọ nta vootu ugbua, ịmara na udiri vootu anyị ga-enwete ga-agba ọkpụrụkpụ".
Ihe mere m ji akwado Onyeisiala Bola Tinubu
Gọvanọ Peter Mbah kọwara na ọ bụ maka 'udiri ọrụ Onyeisiala Tinubu na-arụ nakwa ka osi hụ ndị Enugu state n'anya' mere ha jiri tulee ya ma kpebie ịkwado ya.
Mbah kwuru na tupu ya abanye APC, Onyeisiala Tinubu emeela ma gosi ezi ịhụnanya o nwere n'ebe Enugu state nọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe akwammiri dị na 'Naịra Triangle' n'ebe Artisan dara, ọ bụ Onyeisiala zitere mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ David Umahi ka ọ bịa mezie akwammiri ahụ ngwa ngwa.
Ọ sị na ya nwere ọtụtụ nkwa ya kwere ndị Enugu tupu ya abanye APC ma kwuo na ibanye APC ga-enyere ya aka imezu nkwa ya kwere.
Anaghị m akpagbu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzo – Gọvanọ Mbah
Banyere ebubo na ọ na-akpagbu pati ndọtọndọrọ ọchịchị opposition, Gọvanọ Mbah kwuru kpọm kwem na ya adịghị akpagbu ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndi ọzọ n'Enugu state.
O kwuru na "Ọ bụghị eziokwu na ana m akpagbu pati opposition n'Enugu state maka na ọrụ m dịka Gọvanọ bụ ịhụ na onye maọbụ ndị ọbụla nwere ohere isonye na pati ọbụla masịrị ha ma zọọ ọkwa na ya."
Ọ gara n'ihu kwuo na ebubo a na-ebo ya banyere ịmanye ego dị otu nde narị na iri ise (N150M) tupu pati opposition emee mgbasaozi ndọrọndọrọ ọchịchị n'Enugu state abụghị.
"Nke bụ eziokwu bụ na ọ bụghị naanị ndị opposition na-akwụ ụgwọ ahụ, pati niile chọrọ ime mgbasaozi ndọrọndọrọ ọchịchị n'Enugu state na-akwụ ya. Pati APC kwụrụ ya., ka Gọvanọ Mbah kwuru.
O kwuru na ụlọomeiwu Enugu state si usoro iwu kwadoro mepụta iwu kwuru na pati ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla ga-akwụ N150m tupu ha nweta ikike ime mgbasaozi ọbụla.