A chọtala akụrụngwa ndekọ okwu 'Cockpit' nke ụgbọelu ndịagha kpọkara n'Ondo state

Ọ bụ ụgbọelu ndịagha nwere akara NGR 931 bụ ụdịrị nke a kpọrọ ATR 42-500 ma bụrụkwa ụdị nke kpọkara n'Igbokoda dị n'Ondo state.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndịagha ụgbọelu Nigeria bụ Nigeria Airforce (NAF) ekwuola na ha enweela ọganihu ọzọ n'ọrụ ịchọpụta ihe kpatara ụgbọelu ụdị ATR-42 kpọkara n'obodo Igbokoda, dị n'Ondo state, site n'ịchọta akụrụngwa na-edekọ ụda na okwu n'ime ụlọ ndị na-akwọ ụgbọelu bụ 'Cockpit Voice Recorder – CVR'.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha ụgbọelu Nigeria bụ Ehimen Ejodame wepụatara n'ụbọchị Fraịde 6 Nọvemba 2026, ka ha kwuru na ndị ọkachamara sitere n'ụlọọrụ ndịagha ụgbọelụ Nigeria na ụlọọrụ Nigeria na-ahụ maka nnyocha nchekwa (NSIB) akwadola na akụrụngwa ahụ emebighị emebi.

Dịka o si kwuo, e nwetala akụkụ ụfọdụ nke akụrụngwa na-edekọ ozi ụgbọelu bụ 'black box' n'olu Bekee, ebe a ka na-agbakwa mbọ ịchọta ma weghachite akụkụ fọdụrụ na ya.

O kwukwara na ha achọtala ihe ndị ọzọ fọdụrụ n'ụgbọelu ahụ gụnyere akụkụ igwe ya, yana ahụ mmadụ.

NAF kwuru na ọrụ ịchọta ihe ka na-aga n'ihu n'ime ebe apịtị siri ike, ebe ndị otu dị iche iche na-arụ ọrụ iji chọta akụkụ ụgbọelu ndị fọdụrụnụ ma kwado usoro nnyocha teknụzụ dị mkpa.

Cheta na ụgbọelu ndịagha Nigeria nwere akara NGR 931 kpọkara na mpaghara Igbokoda dị n'okpuru ọchịchị Ilaje nke Ondo steeti n'ụbọchị Mọnde 5 Ọktoba, 2026, mana anyị ghọtara na ụgbọelu ndịagha nwere akara NGR 931 bụ ụdịrị nke a kpọrọ ATR 42-500.

Otu foto na-egosi ihe fọdụrụ n'otu n'ime ụgbọelu agha abụọ nke ndịagha ụgbọelu Nigeria, nke dara n'ugwu Katampe, nke dị n'akụkụ obodo Abuja, n'oge a na-eme nkwadebe maka emume ncheta ụbọchị nnwere onwe Nigeria, n'ụbọchị 28 nke ọnwa Septemba, afọ 2018.

O kwuru na ha na-eme nnyocha ahụ nke ọma iji hụ na achọpụtara ihe niile zuru oke ma dabere n'ihe akaebe.

Ndịagha ụgbọelu Nigeria gbakwụnyere na usoro nchọta ihe ahụ gụnyekwara iji nlezianya jikwaa ozu ndị nwụrụ anwụ, ebe ndị ọrụ nchịkwa nke njirimara na nhazi Directorate of Identification and Classification (DIC) na-eme usoro dị mkpa maka ịchọpụta njirimara kwesịrị ekwesị.

O kwuru na ha na ezinụlọ nke ndị ahụ ihe mberede ahụ metụtara na-akpakọrịta, iji nweta ozi na nkwado ga-enyere ọrụ ha aka.

Ụlọọrụ NAF kwukwara na mkparịtaụka ya na ndị ọchịchị dị mkpa gbasara nchegbu gburugburu ebe obibi nke ndị obodo Igbokoda kwupụtara ka bụ ihe ha na-elebanyere anya iji nye nzaghachi sara mbara.

Ha kwuru na ebumnuche kachasị abụghị naanị ịchọpụta ihe ndị butere ihe mberede ahụ kamakwa ịmụta ihe dị mkpa iji mee ka nchekwa ụgbọelu sikwuo ike, kwalite ọrụ nchekwa ụgbọelu na-aga n'ihu ma chekwaa ndụ ndị ọrụ na ụmụafọ Nigeria.