Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Canada ewepụtala atụmatụ ohụrụ ga-enye ndị mbịarambịa 5,500 si Africa akwụkwọ obibi
Mba Canada ewepụtala atụmatụ akwụkwọ obibi ga-eme ka ndị mbịarambịa ji ezigbo aka ọrụ bata na mba ahụ ma biri.
Nigeria, Cameroon na mba dị icheiche na mpaghara Africa so na ndị ga-akacha rite uru n'inwete akwụkwọ obibi ọhụrụ ahụ.
Canada chọrọ iji atụmatụ ahụ nwete ndị ọrụ ruru puku ise na narị ise (5,500) ga-ebiri n'ime obodo mba ha na-arụ ọrụ.
Mba ahụ kwuru na ndị ha na-achọ bụ ndị nwere ezigbo ọrụ aka, ndị na-asụ asụsụ ha, gụọ akwụkwọ ma nwee ego ga-enyere ha aka ibi nke ọma na mba ahụ.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
N'abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba ka Minista na-ahụ maka mbata na ọpụpụ na mba Canada bụ Lena Metlege Diab kwuru na atụmatụ ahụ ha kpọrọ "Rural Community Immigration Pilot " ga-agbanwe ma bụrụzịe "Rural Community Immigration Program".
Ọ sị na atụmatụ ọhụrụ ahụ ga-ebido na 1 Jenụwarị 2027 ma kwuo na ha chọrọ ịnabata ndị mbịarambịa mmadụ 5,500 ma nye ha ohere ibiri nke ọma na mba ahụ.
Sean Fraser bụ nnukwu ọkaiwu mba ahụ ma bụrụkwa minista na-ahụ maka ikpe kwuru na atụmatụ ahụ ga-enyere ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa dị na Pictou County aka ma mee ka ndị mbịarambịa nweike ijiri nwayọọ bisaa ahụ na mba ahụ.
Etu ndị nwere aka ọrụ n'Africa ga-esi rite uru na ya
Ọ bụ n'ime obodo maọbụ mpaghara dị icheiche na mba Canada ka ndị ga-erite uru n'atụmatụ 'Rural Community Immigration Program' ahụ ga-arụ ọrụ .
Mpaghara ndị ahụ gunyere Pictou County, North Bay, Sudbury, Timmins, Thunder Bay, Brandon na Moose Jaw nakwa ndị ọzọ.
Ọ bụ ụlọọrụ nakwa obodo ebe ụlọọrụ ahụ nọ ga-enye onye ahụ ọrụ maọbụ wepụta ohere ọrụ.
Onye a ga-enye ọrụ ga-abụrịrị onye rugoro ọrụ otu afọ, nwe aka ọrụ ya ma na-asụ asụsụ French ma nwe asambodo o kwesiri inwe maka ọrụ ahụ.
Kedụ ihe mere mba Canada ji weputa atụmatụ ahụ?
Mba Canada weputara atụmatụ 'Rural Community Immigration Program' iji kwalite ebe ha na-ada mba maọbụ kwado ngalaba ọrụ ebe ha na-enweghị ọnụ ọgụgụ ndị mara maka ọrụ ahụ zuruoke.
Ngalaba nke a metụtara gunyere ahụike, agụmaakwụkwọ, ire ahịa nakwa ọrụ ndị ọzọ.
Nke a nwereike ịbụ ụzọ ụmụ Africa na-arụ ọrụ nwereike iji banye mba Canada ma ọ bụrụ na ha nwere ihe niile ha kwesiri.