Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Michael Carrick: A na-atụanya na otu egwu bọọlụ Man Utd ga-achụ onye nkụzi ha n'ọrụ
A na-atụanya na otu egwu bọọlụ Manchester United ga-achụ onye nkụzi ha bụ Michael Carrick n'ọrụ.
Man Utd kpebiri ka Carrick nọrọ n'ọkwa ya oge Bournemouth meriri ha 3-0 n'ama egwuregwu nke ha n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọktoba dịka a na-ekwu na ebumnuche ha bụ inyocha ọnọdụ ahụ ọzọ n'oge ezumike egwuregwu mba ụwa nke ọnwa a.
Ọtụtụ mmadụ gwara BBC Sport na ndị otu nlekọta Manchester United ka kwadoro usoro ahụ. Ha kwukwara na ha emebeghị mkpebi ikpeazụ gbasara ọdịnihu Carrick.
Cheta na asọmpi ha na Aston Villa gbara nke kwụsịrị onye lawa onye lawa 4-4 n'ụbọchị Sọnde emeela ka ọnọdụ Manchester United kawanye njọ. Ha nọ ugbu a n'ọkwa nke iri na asatọ na tebụl Premier League, nke bụ mmalite kacha njọ ha nwere n'ime afọ iri anọ.
Ka ọ dị ugbua, ndị nchịkwa otu egwu bọọlụ a na-atụle ndị nwere ike ịnọchi Carrick gụnyere Eddie Howe, Julian Nagelsmann, Antonio Conte na Mauricio Pochettino, onye bụ onye nkụzi otu egwu bọọlụ mba America.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Carrick ga-ata ahụhụ maka mmalite na-adịghị mma
Asọmpi Manchester United na Aston Villa gbara onye lawa onye lawa bụ nke atọ Carrick nọ n'isi ya kemgbe e nyere ya ohere ọzọ ịnọ n'ọrụ ya.
N'ime asọmpi atọ ahụ, Manchester United meriri otu, gbaa onye lawa onye lawa, mana e meriri ha n'otu.
N'agbanyeghị na ndị ọgbaa bọọlụ ha gosipụtara mmụọ ịgba mbọ site n'ịlaghachi ma nweta otu akara site na ọkpụ goolu abụọ ma ruo (4-4).
N'ime asọmpi iri ha gbara na Premier League n'oge a, naanị otu ka ha meriri. Nke a bụ mmalite kacha njọ ha nwere kemgbe oge egwuregwu 1986/87.
Nke a pụtara na ha nwere naanị otu akara n'ihu Crystal Palace, ndị nọ n'ọkwa ikpeazụ, ebe ha enyere goolu iri na itoolu n'asọmpi ahụ.
Gịnị mere ihe ji mebie ọsọ ọsọ n'aka Michael Carrick?
Nsogbu ndị otu egwu bọọlụ Manchester United nwere so n'ihe mere ka atụmatụ Carrick ghara ịga nke ọma.
Ka ọ dị ugbua, Benjamin Sesko ka na-agbake site na merụ ahụ o merụrụ n'ụkwụ ya, ebe Amad Diallo merụkwara ahụ n'ụkwụ nke mere ka ọ ghara ịgba bọọlụ ruo izu asaa.
Nke a mere ka Carrick gbanwee ndị ọ na-etinye n'asọmpi ndị ha na-agba.
Bruno Fernandes, onye bụ ọchịagha otu ahụ, bụkwa otu n'ime ndị ọgbaa bọọlụ a tụkwasịrị obi n'ịzọpụta otu ahụ, mana arụmọrụ ya agbadala nke ukwuu.
Manchester United enweela nsogbu n'ịgbachitere goolu ha, ebe ha na-enyekarị ndị ha na ha na-agba bọọlụ ohere inyeta goolu n'oge ikpeazụ nke asọmpi ha. Ha tufukwara ọtụtụ ohere imeri asọmpi ha kwesịrị imeri.
N'otu oge, Lisandro Martinez, onye nyere onwe ya goolu n'asọmpi ha na Fulham, mechara katọọ etu ndị isi otu ahụ si zụta ndị ọgbaa bọọlụ ọhụrụ, ma taa Jason Wilcox ụta maka ọnọdụ ahụ.
Bruno Fernandes katọkwara atụmatụ Carrick ji agba asọmpi mgbe e meriri ha n'aka otu egwu bọọlụ Atletico Madrid n'asọmpi Champions League.
Manchester United emeriela naanị asọmpi atọ n'ime iri na ise ha gbara n'asọmpi niile n'oge a.
Dịka Manchester United nọ n'ọkwa nke iri na asatọ na Premier League, ọnọdụ Carrick n'ọrụ ya na Old Trafford na-adịwanye ka ihe a na-enyo enyo.