Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Tinubu akwadola ọdọụgbọmmiri 'Ibom Deep Seaport' ma nye ọdọụgbọelu Akwa Ibom ọkwa mba ụwa
Onyeisiala Bola Tinubu akwadola atụmatụ ịrụ ọdọụgbọmmiri miri emi bụ Ibom Deep Seaport, yana ịkwalite ọdọụgbọelu Victor Attah dị n'Akwa Ibom ka site na nye ya ọkwa ọdọụgbọelu nke mba ụwa.
Tinubu kwupụtara nkwado ndị a mgbe ọ na-agwa ndị bi na state ahụ okwu n'emume e mere iji kwanyere ya ugwu n'ama egwuregwu mba ụwa nke Godswill Akpabio, dị na Uyo, n'ụbọchị Fraịde abalị 6 nke ọnwa Nọvemba 2026.
N'olu ya, "Anụrụ m arịrịọ sitere n'aka enyi m, gọvanọ m, na pastọ m, n'aha ndị mmadụ na ndị ndu nke Akwa Ibom satat, gbasara ọdọụgbọmmiri miri emi nke Ibom. Akwadola m ya," ka Tinubu kwuru.
Nkwado a na-abịa dịka Gọvanọ Akwa Ibom state bụ Umo Eno, kwere nkwa na state ahụ ga-enye nde vootu abụọ maka nhọpụta Tinubu ọzọ n'afọ 2027, ma ọ bụrụ na Gọọmentị Etiti akwado ma mee ka e wuo ọdọụgbọmmiri miri emi nke bụ Ibom Deep Seaport.
Tinubu gara n'ihu gbara ndị ruru ịtụ vootu ume ka ha nweta kaadị vootu ha na-adịgide adịgide (PVC) , ma sonye n'usoro ntuliaka na-abịa n'afọ 2027.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Njem nleta Onyeisiala Tinubu gara n'Akwa Ibom, Rivers state
Onyeisiala Nigeria bụ Bola Tinubu, ga-amalite njem ụbọchị abụọ na steeti Akwa Ibom na Rivers n'Ụbọchị Fraịde, ebe ọ ga-emepe ọtụtụ ọrụ mmepe gọọmentị steeti abụọ ahụ rụchara ma sonyekwa na nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị at All Progressives Congress (APC).
Njem a ga-abụkwa ohere nye Tinubu izute ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị na ndị otu APC ka pati ahụ na-akwado onwe ya maka ntuliaka onyeisiala afọ 2027.
Tinubu ga-ebu ụzọ gaa Uyo, isi obodo Akwa Ibom, ebe ọ ga-emepe ọrụ dị iche iche ọchịchị Gọvanọ Umo Eno rụchara tupu ọ gaa nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị APC.
Kedu ọrụ ndị Tinubu ga-emepe n'Akwa Ibom?
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Bayo Onanuga, siri kwuo n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzdee, ọrụ ndị ahụ gụnyere ụlọ ọhụrụ a rụrụ maka ndị njem n'ọdụụgbọelu Victor Attah International Airport, ụlọọgwụ ọdụ ụgbọelu, na ebe obibi 'Ibom Aviation Village'.
Ọrụ ndị ọzọ ọ ga-emepe gụnyere okporo ụzọ Airport-Okopedi nke jikọtara obodo ndị dị na Nsit Atai na Okobo, nakwa Ring Road 3 nke jikọtara okporo ụzọ Idoro na Ikot Ekpene site na Uyo na Ibiono Ibom.
Tinubu ga-emepekwa ụlọ ọrụ AKWA-GIS, ebe a na-ahụ maka nchekwa na njikwa obodo nke akpọrọ 'Command and Control Centre' n'asụsụ Bekee, nakwa ebe ezumike ARISE Palm Resort.
N'ihi nleta onyeisiala ahụ, Gọvanọ Umo Eno ekwuola na Fraịdee ga-abụ ụbọchị ezumike ọrụ na steeti ahụ iji nye ndị bi ebe ahụ ohere ịnabata ya.
Kedu maka njem ya na Rivers?
Mgbe ọ mechara mmemme na Akwa Ibom, Tinubu ga-aga Port Harcourt, isi obodo Rivers, n'ụbọchị Satọde maka nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị APC.
Onanuga kwuru na nke a ga-abụ nnukwu nzukọ ndọrọndọrọ ọchịchị nke atọ onyeisiala ga-eji aka ya gaa, kemgbe ọ malitere achụnta vootu maka ntụliaka ọzọ ya na Kaduna n'ọnwa gara aga.
Dịka onye ndụmọdụ ahụ siri kọwaa, njem ndị a ga-enye Tinubu ohere izute ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị otu pati na ndị na-akwado ya, ma kwalite ịdị n'otu na nkwụsi ike ndọrọndọrọ ọchịchị.
Gịnị mere nleta ndị a ji dị mkpa?
Nleta onyeisiala na steeti abụọ a na-abịa mgbe o kwuburu na ọgaghị eso ndị otu atụnta vootu ya gaa steeti niile n'ihi ọrụ dịịrị ya dịka onyeisi ọchịchị obodo.
N'emume mmalite otu ga-ahu maka achụnta vootu onyeisiala nke APC na Abuja n'ụbọchị iri na anọ n'ọnwa Ọktoba, Tinubu kwuru na ọrụ ọchịchị, ụgwọ ego obodo, na mkpa ọ dị ịdọta ndị ọchụnta ego mba ọzọ agaghị enye ya ohere iso ndị otu achụnta gaa ebe niile."
Nzukọ achụnta vootu Kaduna nke mere n'ụbọchị iri abụọ na anọ n'ọnwa Ọktoba bụ nke mbụ ọ gara n'onwe ya kemgbe a malitere ịchụnta vootu.
Nleta Akwa Ibom na Rivers ga-ewelite ọnụ ọgụgụ nzukọ achụnta vootu ndị ọ gara n'onwe ya, ka ọ na-agbalị ịchịkọta nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị tupu ntụliaka afọ 2027.