Ị na-ele ụdị ngosi nke weebụsaịtị a nke bụ naanị ederede nke na-eji obere data. Lee ụdị izizi nke weebụsaịtị, nke gụnyere foto na vidiyo niile.
Kedụ onye ga-emeri dịka Nigeria ga-ezute Tanzania maka itozuoke n'asọmpi Afcon 2027?
Dịka asọmpi itozuoke n'isonye n'asọmpi African Cup of Nations (Afcon) nke afọ 2027 na-aga n'ihu, ndị otu egwu ụmụnwoke Nigeria ga-ezute otu egwu bọọlụ ụmụnwoke nke mba Tanzania n'ụbọchị taa bụ Fraịde abalị 13 Nọvemba 2026.
Nigeria ga-ezute Tanzania n'ama egwuregwu Godswill Akpabio International Stadium dị n'Uyo dịka ha na-atụ anya inweta mmeri iji hụ na ha nwere ohere itozuoke n'isonye n'asọmpi Afcon 2027.
Dịka tebụlụ asọmpi itozuoke Afcon 2027 si dị, Nigeria na mba Tanzania, Guinea-Bissau na Madagascar nọ n'otu L.
Ka ọ dị ugbua, Nigeria na-agba mbọ ịhụ na ha nwetara mmeri n'asọmpi a maka na Tanzania etozuola isonye n'asọmpi a n'ihi na ha so na mba atọ ga-achịkọba ya.
Cheta na Nigeria agbaala asọmpi abụọ, merie otu ma kpụọ afọ n'ala n'otu n'asọmpi nke abụọ ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Oto ọzọ nọ n'otu L bụ Guinea-Bissau bụ ndị nọ n'isi otu ahụ ugbua dịka ha meriela asọmpi abụọ ma gbaa onye lawa onye lawa n'asọmpi nke atọ ha ebe mba Nigeria nọ n'ogogo nke abụọ maka inweta otu merie naanị.
Madagascar bụ mba ji akara abụọ nọrọ n'ogogo atọ dịka kụrụ afọ n'ala n'asọmpi nke mbụ ha ma gbaa onye lawa onye lawa na asọmpi abụọ ndị ọzọ ha gbara.
Tanzania nwetarala naanị otu akara nọ n'ogogo ikpeazụ dịka ha kụrụ afọ n'ala n'asọmpi nke mbụ ha ma gbaa onye lawa onye lawa na nke abụọ.