Ihe ise ị kwesịrị ịma maka Jensen Huang bụbu onyeisi Nvidia a sị gbara n'ezi tinyere America na gbagharịa

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọomeiwu Ukwu mba America akpọọla onye bụbu onyeisi ụlọọrụ Nvidia bụ Jensen Huang oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n'okwu na ya na otu nwaanyị bụ onye mgbaama 'spy' nke mba China mere ọyị nke tinyere nchekwa America na gbagharịa.

Huang, onye nwunye ya bụ Lori Huang, bụbu onyeisi ụlọọrụ Nvidia tupu ụbọchị Tọzde abalị 12 nke ọnwa Novemba, afọ 2026 bụ oge o tinyere akwụkwọ arụkwaghịm dịka o kwupụtara na ya dinara nwaanyị abụghị nwunye ya.

Akụkọ ahu tinyere America na-agbagharịa metụtara nchekwa obodo dịka a na-atụ uche na China si na AI chips nke Megaspeed zigara China megidere iwu mbupụ ngaghara na America dịka ọ machiri mbupụ nyere ọha ohere ịmata ozi metụtara nchekwa America.

Huang bụ onye nwetara ọzụzụ dịka onye 'eletrical engineer' bụ ya wulitere ụlọọrụ Nvidia ka ọ bụrụ ụlọọrụ nwere agba ọkachasị n'okwu nrụpụta AI.

Lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ merela n'okwu a

1. N'ọnwa Ọktoba, akwụkwọ akụkọ 'Times' bu ụzọ depụta akụkọ na-arụtụ aka na Huang na Alice Huang nwere ihe jịkọrọ ha.

Alice welitere isi n'ụlọọrụ a kpọrọ Megaspeed bụ nke ndị ọrụ nchekwa America na-enyo na ụlọọrụ ahụ na ndị uweojii nzuzo China ji enweta ozi banyere America na-arụkọ.

2. N'ụbọchị ụka, abalị itoolu nke ọnwa Nọvemba, Jensen Huang kwetara na ya na nwaanyị abụghị nwunye ya nwere mmekọahụ na ozi o degara ndị ọrụ ụlọọrụ ya bụ ebe o kwuru sị, "I kwudoghị m na nkwa ịma naanị nwunye m. Agwa mkpara merụrụ ya na ụmụ anyị ahụ. E nweghị ihe m ga-asị na ọ bụ ya mere m ji mee otu a. Ana m arịọ mgbaghara."

3. N'abalị iri nke ọnwa Oktoba, otu onye zụrụ oke na ụlọọrụ Nvidia gbara ụlọọrụ ahụ akwụkwọ ma na-ebubo na ụlọọrụ ahụ na-edughe ndị mmadụ site na akụkọ banyere mmekọahụ abụghị nke alụmdi na nwunye Huang nwere.

3. N'ụbọchị Wenezde, ụlọọrụ akwụkwọ akụkọ 'New York Times' gbara n'anwụ na ọbụghị naanị otu onye ka Jensen Huang mere ọyị, ma kwuo na ya na otu onye welitere isi n'ụlọọrụ Nvidia bụbu ọyị nwoke na nwaanyị.

4. Mba China gọrọ na o nweghị mgbe ha ji mmadụ enyopu America, sị na ọ bụ aha ha ka a na-emetọ n'akụkọ gbasara Nvidia na Jensen Huang.

5. Ego dị ijeri dọla $550 funahụrụ ụlọọrụ Nvidia n'ahịa oke (stock market mba America naanị abalị ise dịka akụkọ banyere mmekọahụ abụghị nke alụmdi na nwunye nke Huang saara ọkụ.

Onye bụ Jensen Huang?

A mụrụ Jensen Huang na mba Taiwan n'afọ 1963, mana ya na ezinaụlọ ya kwagara Amerika ka ọ dị afọ itoolu.

Ọ gụrụ 'electrical engineering' na mahadum 'Oregon State University ma nwetakwa nzre 'Masters n'otu ihe ahụ na mahadum' 'Stanford University'.

Ọ bụ ka ọ na-agụ akwụkwọ ka o zuter nwunye ya bụ Lori Mills oge ahụ.

Ha lụrụ onwe ha n'afọ 1985, afọ asatọ tupu Huang ehiwe ụlọọrụ Nvidia.

Ha mụtrara ụmụ abụọ. bụ ndị ji ọkwa n'ụlọọrụ Nvidia.